A LỤZIE E BIZIE: ỤKPỤRỤ OMENALA IGBO, Ọ KACHA MMA MAKA ALỤMALỤ GA-ANỌMI ANỌMI
Keywords:
Alụmalụ, ụkpụrụ, ezinụlọ, ewumewu ndịọkpụAbstract
Ụmịedemede Chukwu hiwere alụmalụ na ezinụlọ dịka ewumewu ga-echekwa ọnọdọ mmadụ n’ụwa. Ndị Igbo, ndị hụtarala aka Chukwu na nhiwe alụmalụ, weere amamiihe ha tụpụta ụkpụrụ dị iche iche nke ọ ga-abụ ndị gbasooro ụkpụrụ a ga-anọmi anọmi n’alụmalụ ha. Ọ bụ ihe ịtụnanya na ndị ọ pụrụ n’ụzọ gburu mkpara na-eleghara ụkpụrụ a ndị ọkpụ hiwere anya nke kpatara e jizi anụ akụkọ ndị ahụ na-ata ntị n’ezinụlọ ndị Igbo. Nchọcha a, nke gbasoro usoro sọvee gbakwasịrị ụkwụ n’atụtụ nchọcha Social constructivism wee na-ekwu ya n’eze a wara awa ma ọ bụrụ na ndị niile na-abanye n’alụmalụ ga-agbaso ụkpụrụ a ndị Igbo hiwere n’ezi amamiihe ha, akwamaka ndị a a na-ahụta n’alụmalụ ga-ebelata. Nchọcha a bu maka ọdịmma ezinụlọ, ọha ndị Igbo niile nakwa ndị na-eme nchọcha. O nyekwara ntụziaka maka ndị na-akwado alụmalụ n’ọdịniihu.Downloads
Published
2026-02-18