IHE NDỊ IGBO NA-AGBARỤRỤ IHU N’EZINAỤLỌ IGBO: ILEBA ANYA N’IDUUAZỊ UBESIE NA NZEAKỌ
Keywords:
Ezinaụlọ Igbo, Agụmagụ ederede, Iduuazị, Atụtụ Agwa, Atụtụ MarxAbstract
Agụmagụ bụ enyo e ji ahụ ndụ. Ọ na-agba ihe ndị na-eme na ndụ n’anwụ. Ederede a bụ nke nyochara ụfọdụ ihe ndị Igbo na-agbarụrụ ihe n’ezinaụlọ dịka ha si dị n’iduuazị Isi Akwụ Dara n’Ala na Jụọchi. Nchọcha ndị e mere lebara anya n’ọtụtụ ihe gbasara ezinaụlọ malite n’izipụta ọnọdụ ezinaụlọ Igbo, na oke na ọrụ dịịrị onye ọ bụla n’ezinaụlọ mana nke a ga-elebazi anya na nsogbu sitere n’akpachapụghị anya n’ebe ezinaụlọ ahụ dị. Ebumnobi nchọcha a bụ iji akụkọ dị n’ime Isi Akwụ Dara n’Ala na Jụọchi wepụta ihe dị iche iche a na-ahụ n’ezinaụlọ dị iche iche n’ala Igbo. Nchọcha nkọwa a gbasoro atụtụ Agwa na atụtụ Marx. Atụtụ agwa bụ atụtụ Skinar wepụtara nke e ji amata akparamaagwa mmadụ nke agwa na-ezipụta ebe atụtụ Marx bụ atụtụ Karl Marx wubere maka ọchịchị na akụ enwe enwe e ji enyocha agụmagụ ndị a na-emegbụ site n’igosi nkarị n’ụdị ọ bụla. A chọpụtara n’ime ihe ndị a, na Ubesie gosiri etu ezinaụlọ siri ghasaa n’ihi agha, nakwa etu alụmdi siri bụrụ ihe nwaanyị mebiri n’ihi agwa ọjọọ ya. Nzeakọ gbara etu mpako nwaanyị a na-alụ alụ na nlefuanya ọrụ ezinaụlọ dịịrị ya, tinyekwara nna ezinaụlọ ịnwụjụ oyi, na ejighị ihe kpọrọ ihe na ịgbakwazi n’iro, siri ghasaa ezinaụlọ n’anwụ. Ihe ndị a na ọtụtụ ihe ndị ọzọ a na-ahụ n’ezinaụlọ dị iche iche dika ndị odee iduuazị abụọ a siri gosi ha, gosiri na iduuazị ederede Igbo na-ezipụta omume dị iche iche ndị Igbo na-agbarụrụ ihu dịka etu e si ahụ ha n’ezinaụlọ na n’agbụrụ dịkwa iche iche. Nchọcha a ga-enye aka n’ịkwalite agụmagụ ederede ọkachasi iduuazị n’ihina ọ bụ ya bụ ebe mgbado ụkwụ nchọcha a kpọmkwem.References
Ejiofor, L. (1981). Dynamics of Igbo Democracy. University Press.
Emenanjo, N. (1982). Some first thoughts on Igbo literature. Na (Ogbalu, C. na Emenanjo,
N.( Ed) Igbo Language and Culture 2, ihu.47-64. University Press.
Emenyonu, E., (1978). The Rise of the Igbo Novel. Oxford University Press.
Mbah, et-al (2013). Igbo Adị. University of Nigeria Press.
Mojekwu, E. (2003). Language and Style of Ubesie and Nzeakọ Works, Projekti O Dere Iji Nweta Nzere
B.A, Nke o Dejeere Ngalaba Amụmamụ Lingwistiks na Asụsụ, Mahadụm Naijiria, Nsukka.
Ikwubụzọ, I. (2012). Family and The Igbo Novel, African Study Monographs, Vol.33 No. 3, pp.145-163.
Nwadike, I. (2002). Agụmagụ Igbo: Iduuazị, Akụkọ Nkenke, Ejije na Abụ. (1933- 2001). Akwụkwọ o
dere na Semina na Mmụta Asụsụ Igbo na Senchụrị nke iri abụọ na otu, n’ọnwa Juun, n’ụbọchi iri
na abụọ ruo na iri na atọ, na Mahadum Naijiria Nsukka.
Nzeakọ, T., (1981). Jụọchi. Macmillian Nigeria Publishers.
Ogbuagụ, J.O, Udemmadu, T.N & Anedo, A.O. (2012). Ntọala Ọmụmụ Agụmagụ na Omenaala Igbo.
John Jacob’s Classic Publishers.
Ọgbalụ, C., (1981). Ndụ Ndị Igbo. University Publishing Company.
Okigbo, D. (2005). Understanding the Igbo Family and the Igbo Structure in Academic Journal of
Globalization, Vol. 3 No. 3, pp. 084-091.
Ọzọ, M. (2000). Nnyocha na Ntụcha Iduuazị Agha Nke Tony Ubesie. Projekti o dere iji Nweta Nzere
B.A na Ngalaba Amụmamụ Lingwistiks na Asụsụ Naijiria Mahadum Naijiria, Nsukka.
Ubesie, T., (1973). Isi Akwụ Dara n’Ala. University Press.
Ugonna, N. (1978). A Brief Survey of the Development of the Igbo Novel. Akwụkwọ a kọwapụtara
n’ọgbakọ nke iri na atọ nke Asụsụ Afrịka ndị West, n’ọnwa Aprel, ụbọchi atọ ruo n’ụbọchi asaa
na Kọleji Bay dị na Freetown nke Sierra Leone.