ỤMỤỌKPỤ IGBO: O DOZI KA Ọ BỤ Ọ DỌGHA OBODO?
Keywords:
Ụmụọkpụ, Ezinụlọ, Obodo, Udo, ỌganiihuAbstract
ỤMỊ EDEMEDE Ọ bụ eziokwu na okwu banyere omenala na ọdịbendị ndị Igbo kacha metụta ndị nwoke mana ụmụnwanyị bụ e jewe a ghaghị n’okwu ndị banyere udo, ịdịnotu na ọganiihu obodo ọ bụla. Ụfọdụ okwu ndị a na-ekwu megide ụmụọkpụ na-egosi na e nwere ọtụtụ nghọtahie banyere ọnọdụ ha nakwa ọrụ ndị ha na-arụ maka ọdịmma ezinụlọ nakwa obodo n’ozuzu oke. Nchọcha a so na mbọ na-aga n’ihu iji kwụsị aha ọjọọ a na-akpọ ụmụ̣ọkpụ site n’ịgba n’anwụ, uru ndị ahụ ụmụọkpụ na-abara obodo. Nchọcha a, nke gbasooro usoro sọvee gbagịdekwara ụkwụ n’atụtụ nchọcha structural Functionalism Theory, wee leba anya n’ọnọdụ ụmụọkpụ n’ime steeti ise dị n’ala Igbo, wee sitekwa na ntụcha na ntụchazi ihe ndị a hụrụ wee kwusie ya ike na ọrụ ụmụọkpụ dịka ndị odozi obodo, e nweghị atụ na ngalaba niile nke ndụ. Nchọcha a nke bụ maka ọdịmma ndị naara enwe nghọtahie banyere ọnọdụ ụmụọkpụ n’ala Igbo, ndị na-eme nchọcha nakwa ụmụafọ Igbo niile, nyekwara ezi ntụzịaka ndị a ga-agbaso maka ọdịniihu.Downloads
Published
2026-03-15 — Updated on 2026-03-15