About the Journal
Enyo:
Jọnal otu ndị ji edemede akwalite asụsụ na omenala Igbo
Vọl 4, Nọ 1, 2023
Ozi si n’aka ndị nhazi
“Enyo Jọnal” dịka aha ya siri dị bụ nchịkọta edemede ndị e ji agba n’anwụ, asụsụ, omenala na nsirihundụ ndị Igbo. Ọ bụ ndị na-agba mbọ ka asụsụ na omenala Igbo ghara ịnwụ na-esi na jọnal a bụ “enyo” edepụta edemede ha n’asụsụ Igbo kpọmkwem iji kwalite asụsụ na ụzọ ndụ ndị Igbo. Jọnal a na-anabata nchọcha ọbụla e demara edema, hazie nke ọma ma bụrụ ọkpọkọpị nke odee.
Odee ọbụla nwere mmasị nwere ike ime nchọcha n’isiokwu ọbụla metụtara asụsụ, omenala, agụmagụ, akụkọala, nsirihundụ, ekpemekpe, ọchịchị obodo, sayensị asụsụ, na ihe ọbụla metụtara ndụ mmadụ.
Ọ bụ asụsụ Igbo ka e ji ede edemede na jọnal a maka inye aka welitekwue ọnụọgụ edemede e ji asụsụ Igbo dee.
Ziga edemede gị na ọwa ududo: enyojonal@gmail.com
maọbụ
theclaudemmadu@yahoo.com , tn.udemmadu@unizik.edu.ng
maọbụ ị kpọọ n’ekwentị 08033027892, 07038296805