AGỤMAGỤ EDEREDE IGBO DỊKA ENYO E JI AHỤTA NDỤ: ILEBA ANYA N’AGỤMAGỤ ỤKWA RUO OGE YA NA ISI AKWỤ DARA N’ALA

Authors

  • Juliet Ifunanya Okeyika Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka na Eshia Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka Steeti Anambara, Naịjirịa

Abstract

Ụmịedemede Agụmagụ Igbo na-egosi ihe dị icheiche na-eme n’ụwa. Ọtụtụ ihe ndị ahụ na-akụziri ọhanaeze ihe ga-abara ha uru. E nweela edereede e dere n’oge gara aga rụtụrụ aka n’ihe yitere isiokwu nchọcha a, mana ha ezipụtachaghị kpọmkwem ihe dabara n’isiokwu nke a. Ha gosipụtara ọghọm dị icheiche agha na-ewetara ụmụ mmadụ site n’iji naanị Isi Akwụ Dara n’Ala wee mee nke ha, mana o nwebeghị edereede gosiri na e nwere ike isi n’akwụkwọ agụmagụ Igbo ndị a họọrọ mata na a gaegosipụtanwụ ụzọ ndụ dị icheiche ọhanaeze ga-esi mụta ihe ga-abara ha ụrụ. Nchọcha a gbara mbọ gbaa n’anwụ etu agụmagụ edereede siri bụrụ enyo na-enyocha ndụ n’oge ugbua. E ji agụmagụ Ụkwa Ruo Oge Ya wee gbaa ndụ ndị mmadụ na-ebi n’oge ugbua n’anwụ nke mere na a ga-esite n’ụzọ dị etua chọpụta ndụ dị mma a ga-ebi na-aga n’ihu, ma chọpụta ndị kwesiri ka e sepu aka na ha. E jikwazi agụmagụ Isi Akwụ Dara n’Ala wee gbakwaa ndụ ndị mmadụ biri n’ala Igbo n’oge agha Biafra n’anwụ, ka ndị amaghị maka ya, mata ụfọdụ ihe mere n’oge ahụ ma sikwa n’ụzọ dị etu a chọpụta na ụfọdụ ihe mere n’oge ahụ na-emekwazi n’oge ugbua n’agbanyeghị na a naghị alụ agha. Edereede a ga-enye aka ịgbazịrị ndị ga-agụ ya ndụ ha site n’iṅomi agwa ndị dị n’akwụkwọ ndị a họọrọ ma nwekwa ndị a ga-ahapụ niihina ha abụghị ezi ndụ. Ọ ga-aka mma ka agụmagụ edereede Igbo ọbụla na-enwe ihe ọ na-akụziri ọhanaeze site n’ịrutụ aka na ndụ dị icheiche a na-ebi n’ụwa ma ziputa ndị dị njọ na ntaramahụhụ ha, na ndị dị mma na uru ịha, ka ọ ga-abụ onye mara asụ, ọ sụọ n’ikwe, onye amaghị asụ, ọ sụọ n’ụkwụ ya.

References

Ifeagwazi, P. & Okafọ, C. (2006). Nka Edemede Igbo. Onitsha: Mid-Field

Publishers

Ifeka, O. (2009). Mkpanaka Asụsụ Igbo Izugbe. Owerri: Top Shelve Publishers

Iheakaram, P.O. (1994). Introduction to Fiction. Owerri: Heins Publishers

Ikedimma, E.E. (2008). Ụmị Agụmagụ Ọdịnaala na nke E Dere Ede. Onitsha:

Uchac Productions

Mbah, Ikeokwu, Mba, Okeke, Nweze, Ugwuona, Akaeze, Onu, Eze, Prezi & Odii

(2013). Igbo Adị. Enugu: University of Nigeria Press

Nsolibe, O. (2011). Uju Ụtọ Asụsụ Igbo. Onitsha: Perfect Image Publishers

Revised Standard Version Bible. (1967). China: Amity Printing

Ubesie, T.U. (1973). Isi Akwụ Dara n’Ala. Ibadan: University Press

Ubesie, T.U. (1996). Ụkwa Ruo Oge Ya. Ibadan: University Press

Downloads

Published

2025-01-26