NDỤ NA MAHADUM N’AGỤMAGỤ IGBO A HỌỌRỌ

Authors

  • Chisom Nneamaka Okafor Ngalaba Lingwistiks/Asụsụ Igbo Mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu Ịgbarịịam Steeti Anambara, Naịjirịa

Abstract

Ụmụ akwụkwọ na ndị nkuzi ụfọdụ nọ na mahadum na-ebi ndụ etu o si masị ha. Nke a mere na ụdị mpụ a na-ahụ na mahadum na-agba anya mmiri. Ọ bụ nke a kpaliri mmụọ odee ịhọrọ isiokwu a iji lebaaanya na ụfọdụajọ ndụ na ezigbo ndụ a na-ebi na mahadum. Ajọ ndụ a ga-eleba anya bụ onye nkuzi ịkwasa nwata akwụkwọ iko, ọ kachasị nwata akwụkwọ nwaanyị makainye ya akara ruru ya ma ọ bụ nke erughi ya, otu nzuzo na mpụ ule. Ezi ndụa ga-eleba anya bụ nwata akwụkwọ nwaanyị ịlụta ezigbo di n’ihi ezi agwa ya.Agụmagụ ndị a họọrọmaka nchọcha a bụ;Okwe Agbaala na Adaeze. Ngwaọrụ edemede a bụ agụmagụ ndị a na edemede ndị ọzọ metụtara isiokwu a. Nchọcha a ga-agbalị ịchọpụta ụzọ kacha mma e nwere ike isi belata ajọ ndụ a na-ebi na mahadum, kwado ezi ndụ a na-ebi ma mekwaa ka mahadum bụrụkwa ebe ọ ga-abụ e jee, a nụchaa mmụọ mmadụ anụcha. A gbasoro usoro nkọwa wee mee nchọcha a. Atụtụ e ji mee nchọcha a bụ atụtụ ezi agwa miri emi nke na-ekwu na tupu mmadụ emee ihe, ya tụlee mara ma ihe ahụ ọ na-achọ ime, ọ bụ nke ga-abara ọtụtụ mmadụ uru. A chọpụtara na n’agbanyeghị na ọ bụ eziokwu na ndị nkuzi mahadum ụfọdụ na-akpa agwa ọjọọ ndị a a rụtụrụ aka,mgbe ụfọdụ, ọ bụ ụmụ akwụkwọ ụmụ nwaanyị ụfọdụ na-eji aka ha jekwuru onye nkuzi, ma nke a bụ n’ihi na onye nkuzi ahụ adịla na mbụ kputuo ugwu ya n’ala. A tụrụ alo ka gọọmentị wepụta iwu ga-emegide ndị na-etinye aka n’ụdị arụrụala a ma gbaa mbọ hụ na iwu ndị ahụ e wepụtara bara n’ọrụ. Ọzọ bụ ka e nwee nkwado a ga na-akwado ndị kpara ma bie ezigbo ndụ n’ụlọ akwụkwọ iji wulie mmụọ ha ka ha mere gaa n’ihu nakwa iji kuziere ndị na-ebi ajọ ndụ na ezi ndụ na-akwụ ụgwọ dị mma. E bu n’obi na nchọcha a ga-eme ka ndị nkuzi mahadum kwụsiri ike n’ọrụ ha mara na ọ bụrụgodị na ha jụrụ ịkpaso ụmụ akwụkwọ ha agwa ezighị ezi, nwata akwụkwọ nwere ike ịkpaso ha agwa ezighị ezi, n’ihi nke a, ha chekwaa onwe ha.Ụmụ akwụkwọ ga-esitekwa na nchọcha a mara na ajọ ndụ mahadum enweghị ebe o du mmadụ aga, kama, ọ laa onye ahụ n’iyi.

References

Amulue, O.E. (1994). Theuniversity: an independent City . Enugu: Snaap

Azigbo, T. (2014). The right attitude. Onitsha: Open Page Publishers

Azigbo, T. (2010). Life and kampus. Onitsha: Open Page Publishers

Deụter, J.E. (2017).Sexual abuse in universities. E si na http//www.MIIT.orgnweta nke a ka ọnwa

Jenụwarị afọ 2020 dị na mkpụrụ ụbọchị iri na asaa

Dike, S.T. (2009). The mind of an abused child. Ibadan: Pacific Books

Enuoyibo, T. (2018). Inside the institution. Ibadan: Elim Publishers

Foo, K. (2019). The three types of people to avoid in the university. E si nahttp://www.karenfoo.comnweta nke a ka ọnwa Maachị afọ 2020 dị na mkpụrụ ụbọchị iri

Ifeka, O.(2010).‘Mahadum’. N’Ifeka, O., Nsolibe, O & Ezechukwu, T. (Ọhz.). Izunwanne

(Anthology of modern Igbo Poetry). Onitsha: Perfect Image

Mezie-Okoye, N. O. (2014). ‘Womens’ health and fundamental human rights’. NaJournal of civic

education and fundamental rights. Vọl. 6. No.3 ihu 20-41

Nwabufo, U. M.(2010). ‘Behavourial changes in women’. NaJournal of nutrition and womens’

health, vọl. 2 No. 8 ihu115-123

Nwadike, I. (1998). Adaeze. Obosi: Pacific Publishers

Nwadike I. (1991). Okwe agbaala. Lagos: Macmilian

Okedịadị, N. (2003). Ijeụwa. Nsukka : Fulladu Publishers

Oranyelu, O. (2002). Sọchima. Ibadan: Crystal Publishers

Oranyelu, O. (2014). Change the system: Change the university. Enugu:Crystal Publishers

Orji, S. (2014). ‘Mahadum’. N’Ifeka, O. (Ọhz.) Ibeene (Anthology of Contemporary Igbo Poetry).

Onitsha: Perfect Image

Osunkwo, E. (2010).Foundation for university students . Enugu: Elite Publishers

Tinibu, S. (2018). ‘Examination malpractice: Things every Nigerian student should know’. E si

na https//www.legit.ng nweta ka ọnwa Jenụwarị afọ 2021 dị na mkpụrụ ụbọchị iri abụọ

na iteghete.

Downloads

Published

2025-01-26