NGAKỌ AKỤKỤ AHỤ NA NGWAA N’IGBO
Abstract
Akụkụ ahụ mmadụ bụ ihe ndị ahụ a na-ahụta n’elu nakwa n’ime ahụ mmadụ dị ka ọdịdịchi ya siri dị. N’aka nke ọzọ, ngwaa bụ nkejiasụsụ na-egosi ihe e mere n’ahịrịokwu. O so na nkejiasụsụ kacha dị mkpa n’ihi na ọ bụrụ na e nweghị ya, agaghị enwe ahịrịokwu zuru oke. N’ụtọasụsụ Igbo, ngwaa anaghị ahọ akụkụ ahụ aghara aghara; etu a ka ọ dịkwa akụkụ ahụ n’ịhọrọ ngwaa ha na ya ga-agakọrịta. A ga-ezipụta ihe akụkụ ahụ na-eme nakwa ihe a na-eme akụkụ ahụ. Ihe kpalitere mmụọ nwanchọcha ịbagide ọrụ a bụ na o nwebeghị onye mere nchọcha n’isiokwu a bụ ngakọ akụkụ ahụ na ngwaa n’Igbo.A gbasoro iwu nhọrọokwu ma ọ bụ ngakọrịta okwu n’ọrụ a. E jikwara usoro nkọwa wee tụchaa nchọcha a. Ka a tụchasịrị ọrụ a, a chọpụtara usoro ngakọrịta akụkụ ahụ na ngwaa; akụkụ ahụ ọ bụla nwere ngwaa ọ na-ahọrọ ma ọ bụ ha na ya na-agakọ. A chọpụtara na ụfọdụ n’ime akụkụ ahụ ndị a na-enye aka na mmekọrịta mmadụ na ibe ya, ịkuzi ihe, izi ozi nakwa mkparịta ụbụbọ. Ndị ga-erita elele na nchọcha bụ ụmụ akwụkwọ, ndị nkụzi, ndị mgbasa ozi, dgReferences
Bussmann, H. (1996). Routledge dictionary and linguistics. New York: Routledge.
Dimebo, I.N. & Nna, I.F. (2019). “Akụkụ ahụ dị ka mbụrụ nsinuche n’asụsụ Igbo. Odezuruigbo
Journal Vọl. 3. No. 1.
Ekman, P. & Friesen, W. (1996). The repertoire of non-verbal behavour categories, origins, usage
and coding. Sernotica: MIT.
Emenanjo, E.N. (1991). Nchịkọta asụsụ na ụtọasụsụ Igbo izugbe. Lagos: Longman Publishers.
Emenanjo, E.N. (2006). Language and communication: Myths, facts and features. Aba: E. frontier
Publishers.
Ezeụmụdo, R.A. (1985). Nchịkọta ọmụmụ asụsụ Igbo. Onitsha: Kawuriz & Manilas
Kenechukwu, S.A. (2012). The place of non-verbal aspects of interpersonal communication, in
human relations. Na J.A. Aliede (ọhz.). Today’s readings in mass communication, issues,
insights and perspectives. Ihu 348-353. Lagos: National open University of Nigeria press.
Matthews, P.H. (2007). Oxford concise dictionary of linguistics. New York: Oxford University
Press.
Mgbemena, A.U. (2009). Ntọala usoroasụsụ Igbo. Obosi: Pacific publishers.
Nwachukwu, P.A. (1983). Readings on the Igbo verb. Onitsha: African FEP.
Nwaozuzu, G.I. (2006). Dialects of Igbo language. Nsukka: University of Nigeria press.
Tomori, S.H. (1977). The morphology and syntaụ of present-day English: An introduction. Ibadan:
Heinemann educational books.
Ume, I.A.O. Ugoji, J.U. & Dike, G.A. (1989). Ụmị nkọwa ụtọasụsụ Igbo. Onitsha: Kawuriz
&Manilas Publishers.