NZIPỤTA ỌNỌDỤ ỤMỤNWANYỊ N’AKWỤKWỌ EJIJE IGBO A HỌỌRỌ: IHE ỊDỌ AKA NA NTỊ NYE ỤMỤ IGBO

Authors

  • Nnamdi Ani Nwata Akwụkwọ (PG) Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka na Eshịa Mahadum Nnamdi Azikiwe, Awka
  • Chinelo ChizobaAnachunam Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka na Eshịa Mahadum Nnamdi Azikiwe, Awka

Abstract

Ụmịedemede Ederede a lebara anya n’ọnọdụ ụmụnwaanyị n’akwụkwọ agụmagụ Igbo. Agụmagụ, n’ụdị ekwuru n’ọnụ ma ọ bụ nke ederede nwere otu ihe ọ na-arụtụ aka na ndụ mmadụ, banyere nkwenye na usoro obibi ndụ ha. Agụmagụ ederede Igbo, bụ otu ụzọ ndị odee si egosipụta n’ụzọ doro anya, ihe ndị na-emegasị na ndụ ndị Igbo. Ọtụtụ ndị Igbo anaghị eji asụsụ Igbo ekwurịta okwu, tinyere na ọtụtụ ndị Igbo n’oge ugbu a, anaghị etinyecha uche ha n’ịgụ akwụkwọ agụmagụ e dere n’Igbo. Nke a bụ n’ihi na ha hụrụ nke e dere n’asụsụ ndị ọzọ n’anya karịa nke e dere n’Igbo. Site n’ọnọdụ a, ihe mmụta niile na-adị n’ime akwụkwọ agụmagụ Igbo ndị ahụ, abụrụ ihe ụfọdụ amaghị maka ya. Nchọcha a lebara anya n’akwụkwọ Nwaanyị Bụ Ihe Ukwu igosịpụta ọnọdụ omenaala Igbo dowere ụmụ nwaanyị nakwa ka ọnọdụ ahụ si bụrụ ihe ekwesịghị. Ọrụ a gbasoro atụtụ feminism wee zipụta ihe ndị dị na ya. Ọrụ a chọpụtara na a ka na-eleda ụmụ nwaanyị a mụrụ n’ezinaụlọ anya. Ụfọdụ ka na-asị na ịzụ nwaanyị bụ ịzụrụ onye ọzọ. Ụfọdụ asị na onye mụrụ naanị nwa nwaanyị n’ezinaụlọ ya, gba aka nwa, na ama ya ga-echi. Nwoke mụrụ naanị ụmụnwaanyị anaghị eketa oke ụfọdụ tinyere ụzọ ndịọzọ e sigasị eleda ụmụ nwaanyị anya. Ọ bụ ihe kwere nghọta na ọrụ a ga-ekpughe ụfọdụ mmegbu ndị ahụ a na-emegbu ụmụ nwaanyị dịka ha dị n’akwụkwọ ederede ahụ a họọrọ ma site n’ụzọ dị otu a, mee ka ọhanaeze mara na mmegbu na nleda ụmụnwaanyị anya adịghị mma, maka na ụmụnwaanyị na-ewete ọganihu. Nchọcha a ga-emekwa ka a mata uru na mkpa ịgụ akwụkwọ ederede Igbo baara onye ọbụla bụ onye Igbo.

References

Butler, J. (1990). Gender Trouble. New York: Routledge.

Udechukwu,G, I., Ogbuagu, Joy, O., & Nnyigide, M. N. (2015). Ọmụmụ Agụmagụ na

Omenaala Igbo. Enugu: Format Publishers.

Haraway, D. (1990). A manifesto for cyborgs: Sciences, Tecnology, and socialist

feminism in the 1980s. Na L. Nicholson (ọhz.) Feminism/Postmodernism.

New York: Routledge ihu 190-191.

Obidiebube, J, I. (2015). Nwaanyị Bụ Ihe Ukwu, Anambra: Galaxy Prints.

Nwadike, I.U. (1990). Ntọala Agụmagụ, Nigeria: Ifunanya Publishers.

Okechukwu, C. (2012). Nwaanyị Dị Uru, Anambra: Mis-Vis Publishers.

Onyekaọnwụ, (2015). G.O. akwụkwọ ihe ọmụmụ.

Tong, R. (2001). Feminism Theory. Na N. J. Smelser & P.B. Baltes, (ọhz.),

International Encyclopedia of the Social and Behavioural Sciences. Oxford:

Elselvier. Vọl 9. ihu 5484-5485.

Williams, C. (2001). Feminist Theory: Psychoanalytic. Na N. J. Smelser & P.B.

Baltes, (ọhz.), International Encyclopedia of the Social and Behavioural

Sciences. Oxford: Elselvier. Vọl 9. ihu 5510-5511

Downloads

Published

2025-01-26