ỌDỊMARA NA URU NZU BARA N’EKPEMEKPE ỌDỊNALA IGBO
Abstract
Ụmịedemede Ndị Igbo nwere omenala na nkwenye dị ọkpụ sitere n’ aka ndị ochie mana ọgbọ nọ ugbua naeleghara omenala na nkwenye ndị ahụ anya mezie ka ọtụtụ n’ime ọmarịcha omenala ndị ahụ naanwụ. Ihe kpatara nke a bụ ọchịchị ndị mbịarachịwa na nleghara anya n’ebe ihe e ji mara ndị Igbo. Nzu bụ nnukwu ihe na ndụ ndị Igbo. N’ịnabata ọbịa, ọ bụrụ na ọjị gachaa nzu na-esote ya dị ka ihe e ji ele ọbịa nke mere ya ka ọ bụrụ ngwa keọdịmara n’ekpemekpe ọdịnala Igbo. Ekpemekpe ọ bụla n’ụwa niile nke ekpemekpe ọdịnala Igbo bụ otu n’ime ha nwere ọdịmara dị iche iche e ji mara ya. Ọdịmara nwere ike ịdị n’ụdị ihe ndị a na-ahụ anya ma ọ bụ ihe a naghị ahụ anya, okwu ọnụ ma ọ bụ agwa nwere nzipụta ihe ndị ahụ na-enyere ndị isi ekpemekpe aka ịkụziri ndị otu ha eziokwu dị n’ihe ha kwenyere. Ebe ọdịmara na-adịkarị n’ụdị ekereuche, o nwerịrị ihe ọ na-anọchi anya ya. Ebumnuche nchọcha a bụ izipụta na nzu abụghị naanị na ọ bụ ọdịmara n’ekpemekpe ọdịnala Igbo kama na o nwekwara uru ndị ọzọ ọ baara ọ bụladị ndị ekwenyeghị n’ekpemekpe ahụ. Ebumnuche ọzọ bụ igosi ihe bụ ọdịmara n’ekpemekpe ọdịnala. Ụfọdụ ndị odee emeela nchọcha banyere uru na ọdịmara nzu n’ekpemekpe ọdịnala Igbo ndị ha dere n’asụsụ Bekee. Nke a kpalitere mmụọ ome nchọcha ịkwado ihe ndị odee ndị ọzọ derela banyere nzu ma were asụsụ Igbo dee ya nke mere ka ọ pụọ iche. E ji atụtụ Ịntarakshọnism keọdịmara were zipụta na ọdịmara na-akpalite ezi mmekọrịta n’etiti mmadụ, eke na gburugburu ya. A gbasoro usoro nchọcha kenkọwa na kesọvee were mee nchọcha a.Nchọpụta gosiri na nzu bụ ọdịmara na-egosi obi ọcha, nnabata, ịdị asọ dịrị gawa. A tụrụ anya na site na nchọcha a, na ndị Igbo ga-amata na ihe ụfọdụ ha na-ahụ nke nzu bụ otu n’ime ha nwere nghọta miri emi ha nwere nke bụ ihe ha na-anọchi. Nke a ga-eme ka ha were nzu kpọrọ ihe etu o kwesịrị.References
Basu, P.,& Kanu, G. C. (2020). Nzu, Orhue, Sacred Chalk. Re: Entanglements Nigeria (Sierra
Leone) Re:Engaging with Colonia Archieves in Postcolonia Times. https://reantanglements.net E wetere na 22/11/2020
Cohen, A. (1974). A Two Dimensional Man. London: University Press.
Ekeke, E. (2012). The Symbolism of Offor in Igbo Traditional Religion. N’An American Journal
of Social Issues and Humanities, 2, (1) Greetz,
C. (1973). The Interpretation of Cultures: Selected Essays. New York: Basic Book Inc.
Haralambos, M. & Heald, R. (1980). Sociology (Themes and Perspectives). Slough: University
Tutorial Press. Leach,
E. (1976). Culture and Communication: The Logic by which Symbols are Connected. London:
Cambridge University Press.
Madukasi, F. C. (2019). “Symbolism and Significance of White Chalk ‘Nzu’ As a Mechanism of
Improving Human Conditions and Dignity in Igbo Traditional Religion”. Na Research
andAnalysis Journal, 2 ihu 63-74.
Mbiti, J. (1970).African Concept of God. London : SMC Press.
Nnamani, T. (nd). The Significance of ‘Nzu’ in Igbo Culture. www.ndiigbogermany.com
E wetere na 14/10/2020
Nwokoye, A. N.& Eze, P. C. (2017). “Igbo Symbols: Developing Aesthetics Values on the Igbo
Child”. N’ Unizik Journal of Arts and Humanities
Ofuafo, P. U. (2013). “Arts Symbols as a Means of Communicating Religious Concepts in
Urhobo Traditional Religion”. Na The Journal of International Social Research. 6 (27)
ihu 392-397.
Okeke, C. O., Ibenwa, C. N. & Okeke, J. T. (2017). Conflict Between African Traditional
Religion and Christianity in Eastern Nigeria: The Igbo Example.
Journals.sagepub.com E wetere na 11/11/2020
Onuh, J. I. (2016). Sacred Symbols in Igbo Traditional Religion: Shrine as a Case Study.
www.academia.eduE wetere na 28/10/2020
Otubah, G. I. (nd). Different Symbols in Igbo Traditional Religion and Their Functions.
https://www.ajol.infoE wetere na 28/10/2020
Partmentier, R. (1994). Signs in Society: Studies in Semotic Anthropology. Bloomington: Indian
University Press
Ukpokolo, C. (2015). Self-Representation and the Constitution of the Igbo World Among Igbo
Students in a Public University in Nigeria.
www.ocf.berkeley.eduE wetere na 2/12/20