NNYOCHA NSOKWUNYE N’OLU MBANAASAA
Abstract
Ụmịedemede Nsokwunye so n’otu isiokwu pụtara ihe n’ọmụmụ ụtọasụsụ Igbo. Ọtụtụ ndị odee n’otu ụzọ ma ọ bụ nke ozo arụtụula aka na nsokwunye. Nchọcha a chọrọ itinyekwu aka nnyochaa nsokwunye n’Igbo: ihe nsokwunye pụtara, ọmụmaatụ nsokwunye dị iche iche, ọnọdụ ya n’ahịrịokwu, agwa nsokwunye na-akpa, mwepụ nsokwunye n’ahịrịokwu, nkejiasụsụ ndị ha na nsokwunye na-agakọ, ụdịdị nsokwunye e nwere, dg. E ji ileru anya nke ọma n’ụdị nsokwunye ndị Mbanaasa na-etinye n’ahịrịokwu mgbe ha na-ekwu okwu wee nweta ngwa e ji tụchaa nchọcha a. Nchọcha a bụ nke nkọwa. A chọpụtara na nsokwunye abụghị ngwaa; ọnọdụ nsokwunye na-egosi ụdị nsokwunye ọ bụ; ahịrịokwu anaghị emebi ma e wepụ nsokwunye; nsokwunye na-agbatị nghọta ahịrịokwu dg. Na mmechi, nchọcha a chọpụtara na nsokwunye dị mkpa n’asụsụ Igbo n’ihina ọ na-eme ka echiche ahịrịokwu pụta ihe nkeọma ma mekwaa ka asụsụ Igbo na-atọ ụtọ. A tụrụ alo ka e mekwuo nchọcha gbasara nsokwụnye n’olundị dị iche iche.References
Egenti, M.C. (2011). The morphosemantics of the Igbo clitics kwa. N’Uchechukwu C. (ọhz.). Igbo
language studies series 4 eụtensional suffixes and clitics in Igbo. ihu 101 – 118.
Emenanjo, E.N. (1978). Elements of modern Igbo Grammar. Ibadan: University press.
Emenanjo, E.N. (1982). Suffiụes and enclitics in Igbo.N’Ogbalu F.C. & Emenanjo E.N. (ọhz.)
Igbo language and culture vọl. 2 ihu 132-167. Ibadan: University press.
Emenanjo, E.N. (1996). Standard Igbo spelling nsùpe Igbo ìzùgbe A practical guide. Aba: Unique
press.
Emenanjo, E.N., Okolie, O.O. & Ekwe, B.U. (2004). Igbo maka sinịọ sekọndịrị 2. Ibadan:
University press.
Ezeomeke, S.O. (2004). Igodo nghọta ụtọasụsụ Igbo. Enugu: Easy-quality Press.
Nwaozuzu, G.U. (2008). Dialects of Igbo language. Nsukka: University of Nigeria press.
Ndimele, O.M. (2003). Morphology and syntax. Portharcourt: Emhai press.
Nweze, I.M. (2011). Extensional suffixes and clitics in Igbo language: A morpho-semantic
analysis. N’Uchechukwu C. (ọhz.). Igbo language studies series 4 Extensional suffiụes
and clitics in Igbo, ihu 89-100.
O’Grady, W. & Guzman, V. (2009). Morphology: the analysis of word structure. N’ O’Grady W.
& Archibald J. (ọhz.). Contemporary Linguistics analysis: an introduction, ihu 131.
Toronto: Pearson Longman.
Okafọ, C.U. & Ewelukwa, U. (2008). Nhazi asụsụ Igbo maka ule sinịọ sekọndịrị na kọleeji
W.A.S.S.C.E., N.E.C.O., G.C.E., J.A.M.B. Onitsha: A.C. Global publishing co.