NTỤCHA ỤFỌDỤ ASỊNILU IGBO: ỤZỌ NKUZI EZI AGWA
Abstract
Ụmịedemede Asịnilu bụ ụdị ilu Igbo a na-akpọ mmadụ maọbụ ihe ọzọ aha sị na ọ bụ ihe onye maọbụ ihe ahụ kwuru. Ihe abụọ kpalitere odee ileba anya n’ụdị isiokwu a bụ otu ọtụtụ ndị mmadụ si eleghara anya n’ihe ziri ezi ha kwesịrị ime n’ebe dị iche iche na etu ụfọdụ si agwakọ asịnilu na ilu ọnụ. Ihe ndị a kpalitere mmụọ odee iji asịnilu mee nchọcha dị otu a. Ebumnobi nchọcha a bụ isi na nkọwa asịnilu na ilu gosipụta ndịiche dị na ha. Ọzọ bụ ịkọwa ezi agwa na ịchọpụtasị asịnilu ndị na-akụzi ezi agwa na echiche ha nwere. Ngwa nchọcha a si n’akwụkwọ ọgụgụ dị iche iche. Odee jikwa ọgụgụ isi ya dị ka nwaafọ Igbo chepụta ụfọdụ. Nchọcha a gbasoro usoro nkọwasị. Ọ bụ atụtụ njirimee na ndịmkpa ka e jiri tụchaa ngwa nchọcha a, ma chọpụta na asịnilu na ilu abụghị otu. A chọpụtakwara na e nwere ike iji asịnilu kuzie ezi agwa dị iche iche dị ka ikwu eziokwu, idebe oge, ịgba mbọ na ezi agwa ndị ọzọ. A na-atụ aro ka ndị okenye na ndị nọ na ngalaba amụmamụ asụsụ Igbo gbalisie ike n’iji asịnilu na-akụzi ezi agwa ma na-eme nchọcha n’asụsụ Igbo tụmadị n’amụmechiche ka e wee nwee ọtụtụ ihe ederede ndị ga na-ewulite asụsụ Igbo.References
Achebe, C. (1958). Things fall apart. UK: William Heinemann
Emenanjọ, E. N. (1989). Atụmatụ agụmagụ na atụmatụ okwu. Ibadan: Longman Nigeria.
Ifeagwazi, P. A. (2010). Uju atụmatụ okwu Igbo. Onitsha: Edeji Prints.
Mbah, B. M. & Mbah, E. E. (2007). Azụonye lecture on Igbo literature and stylistics. Nsukka:
University of Nigeria.
Ndimele, O. M (2007) Semantics and frontiers of communication (2nd ed) Port Harcourt: University
of Port Harcourt
Nwachukwu-Agbada, J. O. J. (2002). The Igbo proverbs – A study of its content, performance and
functions. Enugu: John Jacob’s Classic Publishers.
Nwadike, I. U. (2003). Agụmagụ ọdịnala Igbo. Nimo: Rex Charles & Patrick.
Obiechina, E. N. (1975) Culture tradition and society in the West African novel. Cambridge :
Cambridge Universiy Press.
Odunke, A. (1981). Ọjaadịlị (Igbo Play). Ibadan: Heinemann Educational Books Nigeria.
Ọfọmata, C. E. (2007). Jụọ m Igbo. Enugu: Format Publishers.
Ọfọmata, C. E (2016). Nsirinweta ilu Igbo (Ilu Igbo, nkọwa ya na nsirinweta ya). Enugu:
Goldfinger publications.
Okafọ, C. U (2017). Ọkacha ụtọasụsụ na omenala Igbo. Nkpor: Mid-Field Publishers.
Okafọ, S.N, Osuji, M.N, & Ụwakwe, O. C (2014) Igbo sinịọ sekọndrị .Onitsha Elites Pụblishers.
Onwụdufo F.O.F (2018) ‘Akọ na uche’ Mmanụ e ji eri okwu (vọl. 2). Igbo proverbs (In English and
Igbo). Ọka: Patrobas.
Opata, D. U. (1994). Emenanjo and generic study of Igbo wellelrism.” Nsukka Journal of the
Humanities. Vol. 7, 60 – 67.
Ugonna, N. (1974). “In spoken Igbo literature.” Lagos: Notes And Records
Wilson, R. (1992). Mass media, mass: An introduction. New York: McGraw Hill.