NTỤCHA ỤDAOLU NA MMỤBA ECHICHE OKWU N’IGBO

Authors

  • Ogechukwu Linda Mbah Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka na Eshia Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka, Steeti Anambara, Naịjirịa

Abstract

Ụmịedemede Nchọcha a gbadoro ụkwụ n’inyocha etu dị iche iche olu e ji kpọọ okwu Igbo si amụbanye echiche dị n’okwu. Mbunuuche nwa nchọcha bụ ịkọwa ihe ụdaolu pụtara, ịchọpụta ụdị ya, ebe dị iche iche ọ na-abata na mkpụrụokwu na usorookwu nakwa etu o si eweta mgbanwe n’echiche okwu na usorookwu ndị ahụ. Nka e jiri mee nchọcha a bụ nchọcha e dere ede nke a chọpụtara site n’ọba akwụkwọ dị iche iche nakwazị ajụjụ ọnụ a gbara ndị maara nke ekwe na-akụ n’amụmamụ Igbo. Nsogbu nchọcha a bụ na e mebeghị nchọcha n’isiokwu a bụ ịtụcha ka ụdaolu si amụba echiche dị n’okwu Igbo. Atụtụ e jiri mee nchọcha a bụ atụtụ akụkụ nnọrọonwe. Ka e mechara nchọcha a, a chọpụtara na ụdaolu so n’ụmụ akpọmakpọ e nwere bụkwanụ nke na-emetụta echiche maọbụ nghọta dị n’okwu. A chọpụtakwara na ụdaolu nwere ike iweta mmụba n’echiche mkpụrụokwu nakwa usorookwu n’asụsụ Igbo. Ọzọ, e wepụ mmụba echiche dị n’okwu, ụdaolu na-enyekwa aka na mmụba ọnụọgụokwu e nwere n’asụsụ Igbo. Na mmechi, nwa nchọcha na-atụ aro ka onye ọbụla nwere mmasị n’ịmụasụsụ Igbo tụmadụ n’ebe o metụtara akpọmakpọ, nghọta nakwa usorookwu were akwụkwọ nchọcha a gụọ n’ihi na ọ ga-abụ ihe ntuzi aka n’ebe ihe ọmụmụ banyere ụdaolu na mmụba echiche okwu dị.

References

Edeọga, P. N. (2013). Government phonology of vowel harmony in Nsukka variety of Igbo.

Ngụpụta nchọcha Ph.D., Mahadum Naịjiria, Nsụka.

Emenanjọ, E. N. (1978). Elements of modern Igbo grammar: A descriptive approach. Ibadan:

Oxford University Press.

Green, M. M. and Igwe, G. E. (1963).A descriptive grammar of Igbo. Alcademie Verlag, Berlin;

OUP, London.

Greenberg, J. H. (1963). The languages of Africa. Bloomington: Indiana University Press.

Goldsmith, J. (1976). An overview of autosegmental phonology. Linguistic Analysis. Vọl. 2, ihu

-68

Ifode, S. (1995). Basic phonetics. Port-Harcourt: Sunray Publications.

Ladefoged, P. & Johnson, K. (2011). A course in phonetics. (6th ed.) Canada: Michael Rosenberg.

Mbah, B.M. & Mbah, E.E. (2014). Atụtụ amụmamụ asụsụ. Nsukka: University of Nigeria.

Ngoesi, M. C. (2004). Nchịkọta ihe ọmụmụ nke asụsụ Igbo maka ule sịnịọ sekọndịrị. Onitsha:

Optimal Press

Nkamigbo, L. C. (2012). A phonetic analysis of Igbo tone.Third International Symposium on

Tonal Aspects of Languages Nanjing, China, May 26-29, 2012. Site nahttp://www.iscaspeech.org/archivena 20th January, 2020.

Odinye, I. & Udechukwu, G. (2015). Igbo and Chinese tonal system: A comparative analysis. Site

na https://www.researchgate.net/publication/305727370 na 6th August, 2019.

Okoli, C. E. (2017). The tone marking system of the Igbo language: A documentary overview. Igbo

language studies. vọl. 2. Awka: Nnamdi Azikiwe University.

Pike, K.L. (1948). Tone languages: a technique for determining the number and type of pitch

contrasts in a language with studies in tonemic substitution and fusion. University of

Michigan Publication in Linguistics 4 Ann Arbor.

Prince, A. & Smolensky, P. (1993). Optimality theory: Constraint interaction in generative

grammar. Nchọcha maka RacCCS-TR-2. New Jersey: Rutgers University Centre for

Cognitive Sciences.

Udemmadụ, T. N. (2018). Ọmụmụ nghọtaokwu (semantiks). Onitsha: Durability prints.

Ward, I. C. (1936). An introduction to the Ibo language. Cambridge: W. Heffer & Sons.

Downloads

Published

2025-01-26