MBỤRỤ METỤTARA NTAJI ANYA NA NSIRIHỤNDỤNDỊ IGBO

Authors

  • Ethel Odinakachi Orji Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka na Eshia Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka

Abstract

Ụmịedemede Mbụrụ so n’atụmatụokwu e ji ekwu okwu n’ụzọ mkpuke mgbe a chọrọ ikwu ihe na-ata arụ na ntị,ebe ntaji anya pụtara ihe mmadụ nwere ejughị onye ahụ afọ kama ọ na-elegara onye ọzọ anya n’ihe onye ahụ nwere.Nchọcha a lebara anya na mbụrụ metụtara ntaji anya na nsirihụndụ ndị Igbo. E nwebeghị onye mere nchọcha n’isiokwu a bụ mbụrụ metụtara ntaji anya na mbụ. Nke kpalitere nwa nchọcha ime nchọcha a. Mbunuuche nchọcha a bụ ịkọwa ihe ntaji anya pụtara, ịchọpụta ihe ndị na-ebute ntaji anya, ịchọpụta echiche mbụrụ dị iche iche metụtara ntaji anya na nsirihụndụ ndị Igbo. Nka e jiri mee nchọcha a bụ nchọcha e dere ede nke a chọpụtara site n’ọba akwụkwọ dị iche iche nakwazị ajụjụ ọnụ a gbara ndị maara nke ekwe na-akụ n’amụmamụ Igbo. Atụtụ e jiri mee nchọcha a bụ atụtụ njirimee nakwa atụtụ ncheke nke bụ iji ihe nhụrụnanya mado nke nhụrụnuche. Ka e mechara nchọcha a, a chọpụtara na ntaji anya bụ otu n’ime agwa ọjọọ a na-ahụ n’etiti mmadụ na ibe ya, a chọpụtakwara na e nwere okwu mbụrụ dị iche iche metụtara ntaji anya n’Igbo nakwazị ihe ndị na-ebute ntaji anya. Ụfọdụ okwu mbụrụ metụtara ntaji anya a chọpụtara gụnyere; anya mgbakasị, anya ụfụ, iwe obi, asịrị, ekworo, ụfụ obi, ebe ihe ndị na-ebute ntaji anya a chọpụtara bụ: agamniihu, mmụọ ịsọ mpi, nkewa, anyaukwu, ibu iro, esemookwu nakwa e nweghị afọ ojuju. Na mmechi, nwa nchọcha na-atụ aro ka onye ọbụla nwere mmasị n’ịmụ asụsụ Igbo tụmadụ n’ebe o metụtara amụmamụ ncheke were akwụkwọ nchọcha a gụọ n’ihi na ọ ga-abụ ihe ntuzi aka n’ebe ihe ọmụmụ banyere mbụrụ dị.

References

Agbedo, C.U. (2002). General Linguistics: An Introductory Reader. Nsukka: ACE resource

consult.

Chinwe, U.O. & Udoka, E. (2012).Nhazi Asụsụ Igbo maka Ule Sịnịọ Sekọndịrị. Onitsha: Global

Publishing.

Deigmen, A. 92003). “Metaphoric Expression and Culture: An indirect link”. Journal of Metaphor

and Symbols, vol. 18, ihu 255-271.

Finch, G. (2000). Linguistic Terms and Concepts. New York: Palgrave Macmillan.

Lakoff, G. (1987). WOMEN, Fire and Dangerous Things: What Categories Reveal about the

Mind. Chicago: Univrsity of Chicago Press.

Lakoff, G. & Johnson, M. (1980). Metaphors We Live By, Chicago: Chicago University Press.

Lakoff, G. & Turner, M. (1989). More than Cool Reason: A Field Guide to Poetic Metaphor.

Chicago: Univrsity of Chicago Press.

Malmkjer, K. (2002). The Linguistics Encylopedia. (2nd ed.) London: Routledge.

Mbah, B.M. & Edeogu, P.N. (2012). “The Semantics of the verb- ‘se’: A Cognitive Semantics

study” Na International Institute of Science, Technology and Education, 2. 41-45.

Mbah, B.M. & Mbah, E.E. (2014). Atụtụ Amụmamụ Asụsụ. Nsukka: University of Nigeria Press.

Ngoesi, M.C. (2005). Nchịkọta Ihe Ọmụmụ nke Asụsụ Igbo. Nkpọọ: Optimal Press.

Ndimele, O.M. (1999). Semantics and Frontiers of Communication. Port Harcourt: University of

Port Harcourt Publishing House.

Ofomata, C.E. (2013). Ndezu Ụtọasụsụ Igbo. Enugu: Format Publishers.

Ọnụchukwu, I. (2013).Usoro Ihe Ọmụmụ Asụsụ Igbo. Awka: Amaka Press.

Saeed, J.I. (2003). Semantics. Oxford: Blackwell Publishing.

Saeed, J.I. (2007). Semantics. Oxford: Blackwell Publishers.

Udechukwu, G.I., Ogbuagu, J.O. & Nnyịgide, N.M. (2015). Ọmụmụ Agụmagụ na Omenaala Igbo.

Enugu: Format Publishers.

Udemmadụ, T.N. (2018). Ọmụmụ Nghọtaokwu. Onitsha: Durability Prints.

Umezi, P. (2017). “Nsara Echiche nye Mbụrụ Metụtara Anụ Nsọ n’Anambara Steeti”. Ph.D.

Semịna iji mezu nchọrọ ihe ọmụmụ AFL 904 na Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka na

Eshia, Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka.

Wee, L. (2004). Proper Names and Theory of Metaphors. Cambridge: Cambridge University.

Downloads

Published

2025-01-26