MKPỤRỤ ỤDAASỤSỤ NA MKPỤRỤASỤSỤ: MYIRI NA NDỊICHE HA N’OLU ARỌCHUKWU

Authors

  • Ngozi Anyaku Kanu Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka na Eshia Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka Steeti Anambara, Naịjirịa

Abstract

Ụmịedemede Asụsụ bụ ụda mmadụ na-eme nke nwere nghọta site na nkwekọrịta ọhanaeze nwe ya. Asụsụ bụ ụzọ ndị mmadụ si akparịta ụbụbọ site n’okwu ọnụ ma ọ bụ n’odide. Asụsụ ọ bụla nwere olundị dị iche iche mejupụtara ya. Asụsụ Igbo dị ka otu n’ime asụsụ e nwere nwekwara olundị dị iche iche nke Arọchukwu so n’ime ya. Olundị ọ bụla nwere mkpụrụedemede e ji ede ya. Ọ bụ nke a mere ndị amụmamụ sayensị asụsụ jiri bata ịhazi asụsụ ma ọ bụ olundị ndị a. Ha wepụtara ụzọ ihe ise a ga-eji hazie asụsụ ọ bụla ma ọ bụ tule asụsụ. Ha bụ: ọdịdị ụda, ọdịdị ụdaasụsụ,mmebe okwu, usoro okwu na nghọta okwu. Nwa nchọcha ga-ahọrọ isi okwu abụọ bụ mkpụrụụdaasụsụ na mkpụrụasụsụ ma were olu Arọchukwu tulee ha. Ọdịdị ụdaasụsụ ji mkpụrụụdaasụsụ arụ ọrụ ebe mmebe okwu ji mkpụrụasụsụ arụ ọrụ. Nke a bụ kpọm kwem isi okwu a na-eme nchọcha na ya. Ndị ọkammụta dị iche iche emeela nchọcha n’ihe gbasara mkpụrụụdaasụsụ na mkpụrụasụsụ n’asụsụ dị iche iche, mana nwa nchọcha ahụbeghị nke e mere n’olu Arọchukwu. Ọ bụ ya kpatara nwa nchọcha jiri chọọ ime nchọcha n’isi okwu a bụ “Mkpụrụụdaasụsụ na mkpụrụasụsụ: myiri na ndịiche ha n’olu Arọchukwu”. Ebumnuche ndị nwa nchọcha ji eme nchọcha a bụ ịkọwa ihe bụ mkpụrụụdaasụsụ, ịkọwa ihe bụ mkpụrụasụsụ, ịchọpụta myiri dị na mkpụrụụdaasụsụ na mkpụrụasụsụ n’olu Arọchukwu, tinyere ịchọpụta ndịiche dị na mkpụrụụdaasụsụ na mkpụrụasụsụ n’olu Arọchukwu. Usoro nwa nchọcha jiri mee nchọcha a bụ usoro nkọwa. Ọ bụ atụtụ mkpụrụokwu ka nwa nchọcha ji mee nchọcha a. Nwa nchọcha chọpụtara na ọ bụ site na mkpụrụụdaasụsụ ka e si enweta mkpụrụasụsụ. Ya mere nchọcha a ga-abụ enyemaaka nye ndị nkuzi, ụmụ akwụkwọ, ndị odee akwụkwọ Igbo na ndị ọzọ nwere nmasị n’asụsụ Igbo.

References

Anagbogu, P. M, Mbah, B. M and Eme, C. A (2010). Introduction to linguistics. Awka: Amaka dreams

Apakama, L.M. (2006). Ndubata n’ụtọasụsụ na ụdaasụsụ Igbo. Owerri: Divine mercy publishers.

Anozie, C.C. (1999). Lingwistiiki sayensị asụsụ. Nsuka: Fulladu publishing company.

Booij, G. E. (2012). An introduction to linguistics morphology, (13th ed). Oxford: Oxford

University press.

Crystal, D. (2003). The cambridge encylopedia of the English language (2nd ed.). Cambridge:

Cambridge universty press.

Demson, C. F. (2008). Igbo ọgbara ọhụụ maka nkuzi na ọmụmụ asụsụ na ụtọasụsụ Igbo. Aba: C-dems

books publishers.

Dixon, R. M. W (2009). Basic linguistic theory vọl 1. Oxford: Oxford University.

Ewelukwa, U. (2012). Nhazi asụsụ Igbo. Onitsha: A.C. global publishers.

Ezema, T.O. (2012). Nkuzi ụdaasụsụ Igbo. Kontagora: Unique press.

Ezeumudo, R.M. (1985). Nchịkọta ọmụmụ asụsụ Igbo. Onitsha: Kawụriz and Manilas.

Ezeumudo, M.O. (2000). Nchịkọta ọmụmụ lingwistiiks nkọwa. Nsuka: University press.

Emenanjo, N. (2015). A grammar of contemporary Igbo. Port Harcourt: M & S grand orbit.

Kingstan, J. (2007). The phonetics phonology interface: The cambridge hand book of phonology.

Cambridge: Cambridge University press.

Mbah, B.M & Mbah, E.E. (2014). Atụtụ amụmamụ asụsụ. Nsụka: University of Nigeria press.

Murray, T. E. (1995). The structure of English: phonetics, phonology and morphology. Allyn and Bacon.

Nathan, G. S. (2008). Phonology: A cognitive grammar introduction. John Benjamins.

Ndimele, O. (2003). Morphology and syntax. Port Harcourt: M and J Grand Orbit communication

Nwabuko, N. E. (2015). Mkpụrụụdaasụsụ olu Uzuakoli. Ngalaba ọmụmụ asụsụ Naijiria na

Lingwistiks. Alvan Ikoku Kọleeji Keedukeshịọn, Owere.

Odden, D. (2013). Introducing Phonology (2nd ed). Cambridge: Cambridge University press.

Okebaram, G.C, Oguchukwu, N. C. & Nwaigbo, O. I. (2014). Ntụlerịkọta mkpụrụụdaasụsụ olundị Obazụ

Mbieri na Ehime Mbano. Owere: Ngalaba na-amụ asụsụ Naijirịa nke A.I.F.C.E.

Osuagwu, B. I. N, Nwaozuzu, G. I, Dike, G. A, Nwaogu, V. N & Okoro, L. O (1997). Fundamentals

Linguistics. Colon concept.

Roach, P. (2000). English phonetics and phonology: A practical course. Cambridge: Cambridge

University press.

Trask, R.L (2004). A dictionary of phonetics and phonology. Routledge.

Ume, I. A. O, Ugoji, J. U & Dike, G. A (2006). Ụmị nkọwa ụtọasụsụ Igbo. Owerri: Ark publishers .

Umeodinka, A. U, Ugochukwu, C. N, Ogwudile, C. E. C. & Ilechukwu, D. I (2019). Kpọkọpị ụtọasụsụ

Igbo na ntụgharị. Awka: Divine press.

Whitla, W. (2010). The English hand book. New York: Wiley-Blackwell.

Downloads

Published

2025-01-26