AMAGHḷ ASỤ NA AMAGHḷ EDE ASỤSỤ IGBO: ETU Ọ Dḷ NA MAHADUM NNAMDỊ AZIKIWE, ỌKA

Authors

  • Ọlụọma Onyinyechi Amụtaigwe Ngalaba Amụmamụ Igbo, African na Nzikọrịtaozi Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka
  • Florence Uju Ibeh Ngalaba Amụmamụ Igbo, African na Nzikọrịtaozi Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka

Abstract

Ụmị edemede Amaghị asụ asụsụ Igbo pụtara oge mmadụ enweghị ike ịkpọpụtanwu mkpụrụ okwu ma ọ bụ ị sunwu asụsụ Igbo n’usoro kwesịrị ekwesị. Ebe amaghi ede asụsụ Igbo pụtara oge mmadụ enweghị ike itikọtanwu mkpụrụ edemede Igbo ma jiri ya mee ahịrịokwu dabara adaba, nke onye na-agụ ihe ahụ ga-aghọta nke ọma ihe odee bụ n’obi we de ya. Ihe kpalitere nchọcha a bụ ịchọpụta nsogbu ụmụ akwụkwọ Mahadum Nnamdi Azikiwe, Ọka bụ ndị Igbo na-enwe kpatara na ụfọdụ n’ime ha amaghị asụ ma na-edekwa asụsụ ha etu o kwesịrị. Isi ebumnobi nchọcha a bụ: ịchọpụta ihe bụ amaghị asụ na amaghị ede asụsụ Igbo na Ihe butere amaghị asụ na amaghị ede asụsụ Igbo n’ebe ụmụakwụkwọ nọ n’ụlọ akwụkwọ Mahadum Nnamdị Azikiwe nọ. E nyochara akwụkwọ ndị metụrụ aka na ọtụtụ ihe ndị odee kwuru maka isi okwu a. Usoro nchọcha a gbasoro bụ usoro nchọcha kenkọwa. Atụtụ e ji mee nchọcha bụ atụtụ Nnyocha Mmejọ nke Lado 1957. Nchọpụta e nwetara n’ime nchọcha a bụ na nsogbu amaghị asụ na amaghị ede asụsụ Igbo na-esitekarị n’aka ndị nne na nna ndị anaghị asụrụ ụmụ ha asụsụ Igbo mgbe ha na-etolite, enweghị ụlọ mgbasa ozi naanị maka asụsụ Igbo. Nchọpụta ọzọ bụ na amaghị asụ na amaghị ede sitere n’aka ndị isi ụlọ akwụkwọ, ndị nkuzi ụka, ọgbakọ dị iche iche e nwere oge ugbua dị ka ọgbakọ ụmụnna, otu ọgbọ na ndi gọọmenti. Uru nchọcha a bụ na ọ ga-enye aka ime ka ndị nne na nna mata mkpa ọ dị iji asụsụ Igbo bụ asụsụ nne zụọ nwatakịrị mgbe ọ na-etolite. Nchọcha a na-atụ aro ka ndị nne na nna na-asụrụ ụmụ ha asụsụ Igbo, ka e wepụta ụlọ mgbasa ozi naanị maka asụsụ Igbo, ka asụsụ nne bụrụ ihe a ga-eji na akụzi ihe n’ụlọ akwụkwọ dị iche iche dị n’ala Igbo.

References

Anozie C.C (1999). Lingwistiiki sayensị asụsụ. Nsukka: Fulladu Publishing Company.

Chukwuma, N.C. (2014) “Ọnọdụ asụsụ Igbo n’ụlọ akwụkwọ sekọndịrị namkpobi ụkwụ ọnaewetara ọmụmụ asụsụ Igbo na mahadum”.

Crystal, C. C. (1971). Linguistics. London: Hazell Watson and Viney

Emenanjọ, E. N (1991) Nchịkọta asụsụ na ụtọ asụsụ Igbo izugbe. Lagos: Longman

Johnson, S. (1979). A dictionary of English language. London. Times books.

Littlewood, (2000). Oral and written communication. London: Longman.

Obidiebube, J. I (2009) Ndubanye n’ọmụmụ ọlụ asụsụ Igbo. Onitsha: Auschaki Int’l

Publishers

Ogbalu, F.C (1967). Standard Igbo path to it’s development. Onitsha: Versity Industrial Press.

Onuọra, J. C (2009). Usoro ọmụmụ Igbo: Onitsha Patmonic Printeres & Publishers.

Onuọra, J. C (2015). Usoro ọmụmụ Igbo: Onitsha Patmonic printers & Pub.

Oraka, L.N. (1983). Fundamentals of Igbo studies (A Short History of the Igbo study of

languages and culture). Onitsha: University Press.

Onwuejeogwu, M.A. (1981). An Igbo civilization: Nri kingdom and hegemony. London:

Ethiope Publishing Corporation.

Ume, A.C. (2014). ‘Ndejọ ụtọasụsụ Igbo; etu ọdị n’etiti ụmụ akwụkwọ na-amụ asụsụ Igbo na

Mahadum Nnamdi Azikiwe, Ọka’

West, M. (1981). The New English dictionary. Great Britain: Longman.

Downloads

Published

2025-01-27