Mwepụ n’Olu Ọka n’Usoro Ụtọasụsụ Nnwogharị
Abstract
Ụmị edemede Mwepụ bụ ụdị nnwogharị nke na-eme ka mkpụrụokwu ma ọ bụ nkebiokwu dịbu na ndokọ omimi ahịrịokwu ghara ịpụta na ndokọ elu nke otu ahịrịokwu ahụ. Nchọcha a lebara anya n’ụdị mwepụ dị iche iche na-apụta n’olu Ọka. Ihe kpalitere mmụọ nwa nchọcha ileba anya n’isiokwu a bụ na e nwebeghi ọtụtụ nchọcha e merela n’isiokwu a mbụ. Ebumnobi nchọcha a bụ iji usoro ụtọasụsụ nnwogharị wee ileba anya ma tụpụta ụdị mgbanwe dị iche iche metụtara ụtọasụsụ na-adapụta n’olu Ọka. Ọzọ bụ ịchọpụta ka olu Ọka si ahazi mkpụrụokwu na ndokọ okwu, ọ kachasị mgbe ọ na-ezipụta mwepụ mkpụrụasụsụ, mkpụrụokwu ma ọ bụ nkebiokwu. Nchọcha a bụ nchọcha kesọvee, a gbasokwara usoro atụtụ ụtọasụsụ nnwogharị nke Noam Chomsky wee mee ya. Na nchọcha a, a chọpụtara na mgbanwe pụtara n’olu Ọka dị ka o si pụta n’olu Igbo Izugbe. A chọpụtakwara na ụfọdụ irighiri okwu dị na ndokọ omimi na-apụ na ndokọ elu nke ahịrịokwu n’ihi nnwogharị nke ahịrịokwu ahụ gabigara. Nchọcha a ga-abara ọtụtụ ndị uru, ọ kachasị ndị amụmamụ ụtọasụsụ Igbo. Nwa nchọcha na-atụkwazị aro ka e were usoro ụtọasụsụ nnwogharị lebakwuo anya n’olu asụsụ Igbo dị iche iche iji bawanye ngwa ọmụmụ asụsụ Igbo.References
Agbedo, C. U. (2000). General Linguistics: An Introductory Reader. Nsukka: ACE Resources
Consult.
Akabogu, C. H. (2019). Etu iji okwu Igbo asụ asụsụ si egosi ebe onye si n’ Odezuruigbo. Vol.
No 1. Agulu: Thinkers Publishers.
Anagbogu, P.N., B.M. Mbah & C.A. Eme (2010). Introduction to Linguistics. Awka: Amaka
Dreams.
Anozie, C.C. (1999). Lingwistiiki Sayensi Asusu. Nsukka: Fulladu Publishing Company
Bolton, W. F. (1982). A Living Language: The History and Structure of English. Random
House.
Chomsky, N. (1957). Syntactic Structures. The Hague: Mouton.
Chomsky, N. (1965). Aspects of the Theory of Syntax. Cambridge: MIT Press.
Chomsky, N. (1975). Reflections on Language. New York: Pantheon.
Crystal, D. (1971). Linguistics. Maryland: Penguin Books Inc.
Crystal, D. (2004). The Language Revolution. MA: Polity Press. E wetere na
https://www.journals.eọuinoụpub.com. 20/02/2022
Emenanjo, E.N (1978). Elements of Modern Igbo Grammar. Ibadan: Oxford University Press.
Ezeumudo, M. O. (1985). Nchịkọta Ọmụmụ Asụsụ Igbo. Onitsha: Kawuriz and Manilas
Publishers.
Fromkin, V, Rodman, R. & Hyams, N. (2011). An Introduction to Language. Wadsworth:
Cengage Learning.
Hartwell, P. (1987). Grammar, Grammars and the Teaching of Grammar. A Sourcebook for
Basic Writing Teachers. New York: Random House.
Hornby, A. S. (1974). Oxford Advanced Learners Dictionary of Current English. Oxford
University Press.
Hudson, R. A. (1980). Sociolinguistics. Oxford: Cambridge University Press.
Kolln, M. & Funk. R. (1998). Understanding English Grammar. Allyn and Bacon.
Mbah, B. M. & Mbah, E. E (2014). Atụtụ Amụmamụ Asụsụ. Enugu: University of Nigerian
Press.
Mbah, B. M. (2006). GB Syntax: Theory and Application to Igbo. Enugu: St. Jon- Afam
Publications.
Ndimele, O. M. (1999). A First Course on Morphology and Syntax. Port Harcourt: Emhai
Printing and Publishing.
Nwala, M. A. (2004). Introduction to Syntax: The Student’s Guide. Abakaliki: Wisdom
Publishers.
Ofoegbu, C. O. (2008). Syntax: An Introductory Text. Enugu: Malchpag publishers.
Ofomata, C. E. (2012). Omenala na Odinala ndi Igbo. Enugu: Format Publishers.
Ozo-Mekuri, N. (2016). Convergence: English and Nigerian Languages. Festschrift for Munzali A.
Jibril. Port Harcourt: M & J Grand Orbit Communications ltd & Emlai Press.
Prasad, T (2014). A Course in Linguistics. New Delhi: PHI Wearing publishers.
Richard, N. (2020, Aug, 26). English Grammar: Discussions, Definitions, and Examples. E
wetere na https://www.thoughtco.com/whatisgrammar-1690909. 20/02/2022
Scott, T. (1999). How to Teach Grammar. England: Pearson Education.
Seinde, A. (1985). Literary Appreciation. Ibadan: Onibonoje Press and Book Industry Nig.
Tomori, S. H. (1977). The Morphology and Syntax of Present-Day English. Ibadan:
Heinemann Educational Books.
Udemmadu, T. (2014). Nkuzi Sintaks na Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrika na Nzikọrịta Ozi,
Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka.
Umeh, I. N. (2018). Mwepu n’Utoasusu Asụsụ Igbo n’Odezurigbo. An International journal
of Igbo, African and Asian Studies. Vol.1. 107-119.
Umeodinka, A. & Ugochukwu, C. (2016). Asụsụ Igbo dị ka Ngwa Ahịa n’Odezuruigbo. An
International journal of Igbo, African and Asian Studies 1st edition.
Umeodinka, A. U. (2020). Introduction to Contrastive Analysis. Awka: Divine Press.
Williams, J. D (1999). The Teacher’s Grammar Book. Mahwah: Lawrence Erlbaum
Associates, Publishers.