NNYOCHA OKWU AKPỌMAKPỌ MAKA NDỊ EZINAỤLỌ N᾿Ọ̀BÀ
Abstract
Ụ̀mị̀ ̀edemede Nchọcha a nyochara okwu ndị ahụ ndị Ọ̀bà ji eme akpọmakpọ n᾿ime ezinaụlọ. Mbunuuche ndị nchọcha bụ ịchọpụta okwu ndị ahụ ndị Ọ̀bà ji eme akpọmakpọ iji mee ka e wepụ mgbagharị anya na nhọrọ okwu akpọmakpọ dabara adaba ọkacha mgbe mmadụ na-akpọ ndị ezinaụlọ ya maọbụ mgbe a na-ekwu maka onye ahụ n᾿azụ ya. Okwu akpọmakpọ bụ okwu ndị ahụ e ji akpọ maọbụ ekwu maka mmadụ n᾿ihu onye ahụ maọbụ n᾿azụ ya. Ọnụọgụ ndị e jiri mee nchọcha dị iri ise na isii nke gụnyere ụmụnwoke na ụmụnwaanyị. E siri n᾿ogbe asaa e nwere n᾿Ọba were họrọ ndị e jiri mee nchọcha. E nwetara ngwaọrụ nchọcha a site n᾿ajụjụ ederede e jiri gbaa ndị a họrọ n᾿ogbe ndị ahụ ajụjụ ọnụ. Nchọcha a mere ka a mara na e nwere ọtụtụ okwu akpọmakpọ ndị Ọba ji akpọrịta onwe ha n᾿ezinaụlọ dịka, aha mmenwa (AMN), aha izizi (AI), aha ikpeazụ (AIK), aha ngosi ịhụnanya (ANỊ), akpọmakpọ aha nkọwa (AAN), akpọmakpọ ịkwa emo (AỊE), aha echichi (AE), aha otutu (AO), akpọmakpọ ke ekele (AKE), akpọmakpọ nkwanye ugwu (ANU), aha izizi na aha ikpeazụ (AIAIK), akpọmakpọ efu (AEF), aha ngosi akaọrụ (ANA), w.d.g. A chọpụtara na ndị Ọba na-akpachapụ anya na nhọrọ okwu akpọmakpọ ndị ezinaụlọ maka ịkwanyere ndị tọrọ ha maọbụ ndị okenye ugwu ruuru ha. Ọkpụrụkpụokwu: okwu akpọmakpọ, Ọba, Ezinụlọ, Nkwanye ugwu, Mmekọrịta.References
Allakbari, M. & Toni, A. (2008). “The realization of address terms in modern Persian in Iran:
A sociolinguistic study”. Linguistik online. 35(3), ihu 250-263.
Braun, F. (1988). Terms of address: Problems of patterns and usage in variouslanguages and
culture. Berlin: Mouton de Gruyter.
Brown, R. & Ford, M. (2003). “Address in American English”. Na D. H. Hymes (ọhz).
Language in culture and society. ihu 123-135.
Brown, P. & Levinson, C. (1987). Politeness: Some universals in languages andcultures.
Cambridge: Cambridge University Press.
Dickey, E. (1997). Forms of Address and Terms of Reference. Journal ofLinguistics. 33,
Ihu255-274.
Eze, A. U. (2004). The origin of my town ῾ọba᾿. A Term Paper Presented in Partial Fulfilment
for the Course Community Life and Development.
Ezeifeka, C. & Ojenugwa, J. S. (2019). “Politeness strategies and address terms in Igbo and
Igala kinship cultures”. Studies in Literature and Language. 18(2), ihu 44-49.
Ideh, A. E. (2019). “Name and politeness: multiple address terms among theIgbo”. Language
in India.E wetere ya nawww.Languageinindia.com. 22/2/2022.
Igbo Phrasebook (2013). Addressing people. E wetere ya
nahttp://igbophrasebookaddress.html 22//2022.
Kahari, G. P. (1990) The Rise of the Shona novel. Gweru: Mambo Press.
Mashiri, P. (1999). “Terms of address in Shona: a linguistics approach”. Zimbezia. 26(1), ihu
-133.
Murphy, G.L. (1988).” Personal reference in English”. Language in Society,17, ihu 121–137.
Nwakego, O. S., & Umezinwa, E. (2015). African Music and the Search for a New Musical
Paradigm: A Study of Ikorodo Dance Group of Orba Enugu State, Nigeria. Open
Journalof Political Science, 5, 128-134. http://dx.doi.org/10.4236/ojps.2015.52015
Okafo, C. U. & Ewelukwa, U. (2018). Nhazi asụsụ Igbo (usoro ọhụrụ) maka sinịọsekọndịrị na
koleeji. Onitsha: A.C. Global Publishing Co.
Ugorji, C. U. C. (2009). “Reflections on address forms: Politeness in Igbo family”. The
International journal of language, society andculture,27, ihu 53–63.
Wardaugh, R. (2010). An introduction to Sociolinguistics. (6th Ed.). Oxford: Blackwell
Yang, C. (2010). “Translation of English and Chinese addressing terms from the cultural
aspect”.Journal oflanguage teaching and research. 1(5), ihu 738-742.