AFA: NGWA ỌRỤ ỊCHỌPỤTA IHE DARA MMIRI NA NDỤ NDỊ IGBO
Abstract
Ụmị edemede Nchọcha a lebara anya n’ịgba afa dịka otu omenala e ji mara ndị Igbo. Ndị Igbo kwenyere n’afa bụ otu ụzọ kwụọtọ e si achọpụta ihe dara mmiri na ndụ ha. N’ihi nke a, a gbara mgbọ wee mee nchọcha a iji wee gboo nsogbu nghọtaghị ọhanaeze na-enwe gbasara igba afa, tinyere nsogbu ịgba afa aghara aghara jupụtara ebe ụfọdụ. Ebe ọ bụ n’ụfọdụ mmadụ chere na ọ bụ naanị nsogbu na-eduba ndị Igbo n’ịgba afa, n’ihi ya ka e ji kọwapụtazịa ihe ịgba afa bụ n’uju, kọwaa ihe dị iche iche na-duba n’ịgba afa ma zipụtakwa uru na ọghọm di n’ịgba afa. A gbasoro usoro sọọvee wee mee nchọcha a. E mere nchọcha a site n’ịgụ ọtụtụ akwụkwọ ndi ọkachamara dere nakwa site n’igba ndị dibịa ụfọdụ ajụjụ ọnụ. Nchọcha a zipụtara na ewezuga nsogbu na o nwere ụfọdụ ihe ndị ọzọ na-eduba mmadụ n’ịgba afa. A chọpụtakwara na o nwere ndi ọ bụ ọrụ ha iche igba afa. Nchọcha a ga-anapụta ọhanaeze n’aka ndị ọ chaa si gbute, ọ chaghị si gbute. Ọ dị mkpa ka ụfọdụ mmadụ ndị ịgba afa na-abụghị ọrụ ha wepụ aka enwe n’ofe tupu ọ ghọọ aka mmadụ; n’ihi na ọ bụ site n’ịgba afa ka ndị Igbo si achọpụta ihe ọ bụla zoro ezo na ndụ. Ha jikwa ịgba afa a chọpụta ihe ọ bụla gbara ha gharị.References
Anozie, C.C. (2003). Igbo Kwenu: Akụkọ na Omenala Ndị Igbo. Enugu: Computer Edge Publishers.
Bascon, W. (1969). Ifa Divination: Communication Between God and Men in West Africa.
Bloomington and London: Idiana University Press.
Derbyshire (1967). Archaeological journal. Volume 87
Ekwealor, C.C. (1998). Omenala na Ewumewu Igbo. Onitsha: Palma Publishers.
Ifemesia, C.C. (1979). Traditional Humane Living Among the Igbo. Enugu: Fourth Dimension.
Isichie, E. (1976). A History of the Igbo People. London: Macmillan Press.
Isidienu, I. C. (2014). “Igbo Traditional Occupation and the Sustance of the Modern Man.” Ideal
International Journal. Suleja: Besing Books.
Ndupu, A. O(1972). Nkwenye n'ekpemekpe ọdịnala. Onitsha : Varsity press.
Njoku, F.O.C. (2008). Essays in African Philosophy Thought and Theology. Enugu: Snaaps Press.
O'Boyle, P. A. (ed.) (1966). New Catholic Encyclopedia. Vol. iv. Columbia : McGraw-Hill.
Ofomata, C. E. (2012). Omenala na ọdịnala Ndị Igbo. Enugu:Format Pubisher.
Ogbalu, F.C. (1972). Omenala Igbo. Onitsha: University Publishers.
Ogbalu, F.C. (1981). Ndụ Ndị Igbo. Onitsha: University Publishers.
Okonkwo J. B. C (1950). Igbo Civilisation, Nri Kingdom and Hegemony. London : Enthnographica.
Okoye, O.L. (2004). Ntụziaka maka Ụdaasụsụ, Ụtoaasụsụ na Omenala Igbo. Enugu: chelys publishers.
Parrinder, E.G. (1980). African Traditional Religion. (3rd Ed). London: Epworte Press.
Syal & Jindal. (2001:5). An Introduction to Linguistics: Language, Grammar & Semantics. New York :
PHL Learning private.
Ubesie, N. T. (1985). Igbo philosophy. Lagos: Lantern.
Udechukwu G. I. (2016). Mgbakoigba Journal of African studies. Vol. 6 No.1.
Udechukwu, G.I., Ogbagu, J.O., na Nnyigide, N.M. (2015). Ọmụmụ Agụmagụ na Omenala Igbo.
Enugu: Format Publishers.
Umeodinka A.U, Ugochukwu C.N, Ogwudile C.E.C & Ilechukwu D.I. (2019). Kpọkọpị Ụtọ Asụsụ Igbo
na Ntụgharị maka ndị Sekọndịrị na Mahadum Awka: Divine press.