NSIRIHỤ NA MPỤTARA AHA ANỤMANỤ ỤFỌDỤ NA NGHỌTA NDỊ IGBO
Keywords:
Nsirihụ, Mpụtara, Aha, Anụmanụ, Nghọta, Ndị Igbo.Abstract
Ụmịedemede Nchọcha a bụ maka nsirihụ na mpụtara aha anụmanụ ụfọdụ na nghọta ndị Igbo. Ndị Igbo bụ ndị na-echemi echiche ime banyere ihe ụfọdụ digasi na gburugburu ha. Aha bụ otu ihe mmadụ na anụmanụ nwekọrọ ọnụ. Ndị Igbo na-enye ihe ụfọdụ aha dị ka ha siri hụ ihe. Anụmanụ ụfọdụ bụ ndị a na-ahụ na gburugburu ebe mmadụ bi, ebe ụfọdụ bụ ndị dịgasị n’ime ọhịa ebe mmadụ ebighị. Ebe aha bụ ihe e ji maara mmadụ anụmanụ na ihe ndị ọzọ. Ihe kpalitere mmụọ nwa nchọcha ime nchọcha a bụ ime ka ndị mmadụ mata na aha ụfọdụ ụmụ anụmanụ ndị a naazagasị bụ naanị etu ndị Igbo nwe ya siri hụta ya. ọzọ, ụfọdụ n’ime ha na-akpa agwa ka aha ha na-aza, etu ha dị n’anya, ebe ha na-enwe mmasị ịnọ dg. ọzọ, bụ ịchọpụta echiche ndị mmadụ banyere aha e nwere anụmanụ ndị a na ihe kpatara eji nye ha aha otu a n’ala Igbo. Nwa nchọcha chọkwara ịmata ma e nwere ugwu na nsọpụrụ ụfọdụ aha ahụ nwere nye anụmanụ na ọrụ aha ndị ahụ na-arụrụ ha n’ụzọ dị iche iche ndị Igbo amabeghị ruo taa. Nwa nchọcha a hụbeghị onye merela nchọcha iji chọpụta aha anụmanụ ụfọdụ na nkwenye ndị Igbo banyere ha. Ihe nwa nchọcha bu n’obi bụ ịchọpụtagasị aha anụmanụ ndị a dịgasị n’ala Igbo n’ụzọ dị iche iche ma detuo ha n’akwụkwọ. Ebumnoobi nwa nchọcha ọzọ bụ ime ka anya ụmụ afọ Igbo meghee site n’ịmata ihe ụfọdụ zoro ezo maka aha anụmanụ nọgasị na gburugburu ebe ndị mmadụ bi. Atụtụ mgbakwasa ụkwụ nchọcha a bụ atụtụ njieme na atụtụ nrụgaara aka. Nchọcha a gosịrị na ụfọdụ anụmanụ ndị a dị ka aha ha siri dị ọmamaatụ eke na-enye agwa n’ahụ ya nke na-ekewasị ekewa, agụ na-ahọ nkọ nke ukwuu, mbe na-ebere n’ala dg. Ebe ụfọdụ na-ezipụta onwe ha site akparamaagwa ha. E nwere ndị na-enye atakamkpo ego n’ụzọ dị iche iche mgbe e ji ha gwọọ ọgwụ maọbụ ree ha eree n’ahịa. ọzọ, nwa nchọcha chọpụtara na anụmanụ ndị a nwere ndị bị n’ebe ndị mmadụ bịgasị ma nwee ndị bi n’ime ọhịa dị ka ndị Igbo siri hụta ha. Nchọcha a bụ nchọcha nkọwasị na nkọwami. Ebe nwa nchọcha siri weta ngwa nchọcha ya bụ n’akwụkwọ ọgụgụ dị iche iche, ajụjụ ọnụ ọ gbara ndị maara ihe ekwe na-akụ n’ebe anụmanụ ụfọdụ dị n’ala Igbo. ọzọ, nwa nchọcha gbara ọtụtụ ndị na-azụ ụmụ anụmanụ ajụjụ ọnụ n’ụzọ pụrụ iche. N’ikpeazụ, nwa nchọcha mejupụtara ebumnoobi ya site n’ime ka ụmụ afọ Igbo mata na aha anụmanụ e nwere n’ala Igbo dị n’ụdị dị iche iche.References
Agyekum (2006). “Anthropological and Philosophical notions of Akan. Personal names”. E
wetara na University of Ghana http://ugspace;ug.edu.gh31 language/linguistics On 25
July, 2016.
Amamgbo, O. C. (2011). Ogechukwu ka mma. Onicha: Ben-Cons Publishers.
Ekwealọ, C. C. (1996). Omenala na ewumewu ndị Igbo. Ọnịcha: Africana First.
Frege, G. (1952). “On sense and reference: Translations from philosophical writings of
Gofflob Frege” Oụford: Blackwell.
Geertz, P. (2006). Person, time and conduct in Bali. An essay in cultural analysis. Program
cultural report series. Yale: South East Asian Studies.
Ilogu, E. (1974). Christianity and Igbo Culture. Ọnịcha: University Publishing Company.
Mbiti, J. S. (1977). African religion and philosophy. London: Edinal.
McGraw, H. (1993). The school dictionary 3. New York: Macmillan.
Nwigwe, B. (2001). “Naming and being Philosophical Investigation on Names and Objects
with special Reference to Igbo anthroponyms”
Retrievedfromwww.naming.1phil212…//antro.com on 26 July, 2016.
Obaji, C. N. (1982). Language: Philosophical magazine. Ikot Ekpene: Bigard. Memory
Seminary Press.
Okodo, A. I. (1988). “Title names of traditional rulers in Anambra State: A sociolinguistic
analysis”. Unpublished B. A. Project, UNN.
Onumajuru, V. C. (2007). “ A semantic and pragmatic analysis of Igbo names”. E wetere
www.Afrejo.net/journals/.../roll0no2art.cm na 26th Julaị, 2016.
Simon, S. (1975). Webster’s new encyclopedia dictionary: London: Sacramento.
Sutherland, E. T. (1991). Marriage of Anansewa. England: Longman.
Ubahakwe, E. (1981). Igbo names: Their structure and their meanings. Ibadan: Daystar Press.
William, B. (2005). The New Encyclopedia Britannica, Vol. 24 Marcropedia. U.S.A.
Encyclopedia Britannica Inc.