NWAANYỊ ỊZỤLITE NWA NAANỊ YA: NZIPỤTA YA N’AGỤMAGỤ IGBO A HỌỌRỌ
Abstract
Ụmịedemede Ịzụlite ụmụaka bụ otu n’ime ọrụ pụrụ iche dịịrị nne na nna. Na nwa dị njọ maọbụ na ọ dị mma, na-esite n’ụzọ nne na nna ya si zụlite ya. Ọ bụ eziokwu na ọrụ a dịịrị nne na nna mana ọ bụ nne ka ọ metụtakarịrị. Mgbe nna pụrụ ịchọ ihe ezinaụlọ ya ga-eri, ọ bụ nne ka ilekọta ụmụ ha dịịrị. ụfọdụ mmadụ kwenyere na ụmụ nwaanyị riri mperi n’ịzụ nwa nke mere na nwa ha zụrụ naanị ha anaghị aba uru ebe ụfọdụ kwenyesiri ike na nwa nwaanyị zụrụ naanị ya anaghị ala n’iyi. N’ihi nke a ka e ji họrọ isi okwu a, ‘Nwaanyị Ịzụ Nwa naanị Ya: Nzipụta Ya n’Agụmagụ Igbo a Họọrọ’. A gbasoro usoro nkọwa wee mee nchọcha iji nyochaa ma chọpụta nkwenye nke dabara adaba. Agụmagụ ndị e ji mee nchọcha a bụ Onye kpaa Nkụ Ahụhụ na Adaeze. Atụtụ e ji mee nchọcha a bụ atụtụ Modarizim. E bu n’obi izipụta na ụmụaka nwaanyị zụrụ na-aba uru, ihe ndị na-ebutere nwaanyị ịzụ nwa naanị ya na ụzọ a ga-esi belata ọnọdụ a. Nchọcha a gaenyere ọhanaeze, ndị nkuzi na ụmụ akwụkwọ aka ịchọpụta na e nwere ike ibelata arụ ụmụ ntorobịa na-eme n'obodo n’oge ugbua ma ọ bụrụ na e nye ụmụ nwaanyị ezigbo nkwado na enyemaka pụrụ iche ka ha wee nwee ike zụpụta ọtụtụ ụmụaka ga-eso dozie obodo. A chọpụtara na ọ bụrụ na gọọmentị mebe iwu ga-enye ụmụaka ụmụ nwaanyị na-azụ naanị ha ohere ịgụ akwụkwọ n’efu, ọ ga-eme ka ụmụaka a hụ obodo ha n’anya ma tụnye ụtụ nke ha ga-eme ka obodo ha na-aga n’ihu. Nke a ga-emekwa ka ọtụtụ nsogbu ndị ntorobịa na-eme n’obodo belata.References
Acholonu, C. (1995). Motherism: The Afrocentric Alternative to Feminism. Afa Publications
Akaeze, C., Aboh, C., Eze, A., & Barnabas, A. (2020). ‘Ọkpụkpụ agwa n’Onye Kpaa Nkụ
Ahụhụ na Amaechina’. In Ekwe Jonal 13(2): 1-9
Alkali, M., Talif, R., Yahya, W. & Jan, J. (2013). ‘Dwelling or Duelling in Possibilities: How
(Ir)relevant are African Feminisim?’. In Journal of Language Studies 13 (3)
Amato, P. R. (2007) ‘Prental divorce and the wellbeing of Children: A meta-Analysis’. In
Psychological Bulletin 110: 24-46
Ezikeojiaku, P. (2001). ‘Themes in the novels of Ubesie’. In Emenanjo, N. (ed.) Tony Ubesie:
The Man and The Artist. Afrịka – Link book
Gounder, S. (15th July, 2012) Reaserch methodology and research method.
www.researchgate.net.
Ifeka O. (2009). Mkpanaka Asụsụ Igbo Izugbe. Top shelve publishers
Ikedimma, E. (2011). Fiịlọsọfị na Ekpemekpe ọdịnala Igbo. Perfect image
Publishers
Ikeokwu, E. S. (2013). ‘Communicating Gender Differences through the Paralinguistics mode
of Drama as Evidenced in Selected Igbo Plays’. In Research on Humanities and
Social Sciences 3(11): 38-47
Khadijah, R. na Dahlan, N. (2012). ‘Child-Rearing Practices and Socio-economic Status:
Possible Implications for Children’s Education Outcomes. In Procedia-Social
and Behavioral Sciences 90 (9) 251-259.
Mberede, I. (2020). ‘Literature Towards Security and freedom in a Functional Democracy’. In
Journal of the Literati Philosophia 6(2):22-31
Nwachukwu, F. (2006). ‘Single Parents and Child Development’.National Centre for
Vocational Education. No 324
Nwadike, I. (1978). Adaeze. Ọnịcha:Pacific
Nwadike, I. (1989). Onye kpaa nkụ Ahụhụ. Ọnịcha: Kawuriz na Manilas
Nwadike, I. (1996). ‘Igbo Contemporary Drama: Early Beginnings, Biblography and
Classification’. In Nsukka Journal of the Humanities (9) 3 105 - 115
Nsolibe, O. (2011) Uju Ụtọasụsụ Igbo. Perfect image
Ode, R. (2011). ‘Women, their Own Worst Enemies: A comparative study of Tess
Onwuneme’s Go Tell it to Women and The Reign of Wazobia’. In Creative
Artist: A Journal of Theatre and Media Studies 6(1) 82-103
Otite, O. & Ogionwo, W. (2006).An Introduction to Sociological Study. Heinemann
Wajim, J. & Shimfe, H. (2020). ‘Single Parenting and its Effects on the Development of
Children’.In The International Journal of Social Sciences and Humanities
Intervention 7 (3) 5891-5902