IKE ỌNATARACHI DỊ N’IME ỤMỤ NWAANYỊ: NZIPỤTA YA N’AGỤMAGỤ NDỊ A HỌỌRỌ

Authors

  • CHISOM NNEAMAKA OKAFOR Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University Igbariam Campus Anambra State
  • NKECHINYERE ANTHONIA NWOKOYE Nnamdi Azikiwe University, Awka

Abstract

Ụmịedemede Ọtụtụ ezinaụlọ nọ n’ọgba aghara taa n’ihi na ụmụ nwaanyị nọ n’ezinaụlọ ndị ahụ leghaara ike dị ha n’ime anya ebe ụfọdụ nọ n’ọnọdụ dị otu a n’ihi na o nweghị onye hụtara ike na uru nwaanyị bara n’ezinaụlọ ahụ. Onye ọbụla tụkwasara obi na ọ bụ nna nọ n’ezinaụlọ bụ onye kachasị. Nke a mere e ji họrọ isiokwu a, ka e wee kọwaara ụmụ nwaanyị na ha nwere ike zoro ezo n’ime ha. A chọkwara iji edemede a kwalite mmụọ ụmụ nwaanyị ma mee ka ike a zoro ezo n’ime ha pụta ihe ka ha ghara iche mgbe ihe ike mere ha. N’ihi nke a, a gbasoro usoro nkọwa wee tụchaa nchọcha a. E ji atụtụ mọdarizim mee nchọcha a. Atụtụ a na-ekwu na n’agbanyeghị mmekpa ahụ na akpọmasị ụmụ nwaanyị na-enweta n’aka ụmụ nwoke, ịhụnanya dị ha n’ime na-eme ka ha leghara mmekpa àhụ ndị a anya, mee ihe ziri ezi ọ kachasị n’ebe ezinaụlọ ha nọ. Ngwa ọrụ edemede a bụ agụmagụ ndị gbadoro ụkwụ n'isiokwu a. Ha bụ, Adaeze na ụwa bụ nke Onye. Agụmagụ abụọ a bụ iduuazị. A chọpụtara na nwaanyị nwere ike pụrụ iche dị ya n’ime nke na-apụtakarị ihe mgbe ihe ike mere ya. Ọ na-agba mbọ mee ihe ọbụla o nwere ike ime ka ezinaụlọ ya ghara ịda. E bu n’obi na edemede a ga-enye aka mee ka ụmụ nwaanyị mara na o nwere ike zoro ezo dị n’ime ha nke mere na otu ọbụla o sila dị, ụmụ nwaanyị na-akwụdo hụ na ezinaụlọ ha adaghị. A tụrụ alo ka ụmụ nwaanyị mara na nzọpụta ezinaụlọ ha dị ha n’aka n’ihi nke a, ụmụ nwaanyị kwesịrị ileghara nleda anya a na-eleda ha, na omume ‘ọ gbasaghị m’ ndị di ha na-eme mgbe ụfọdụ, mee ihe ga-enye aka kwalite ezinaụlọ ha.

References

Brewerton, P. (2019 February 20). Find your hidden Strength. Strength Scope. https://strengthscope.com/find-your-hidden-strength

Ifeka, O.R (2014) (ọhz). Ibènê. Perect Image Publishers.

Nsolibe, O.T (2018). Ụwa bụ nke onye. Perect Image Publishers.

Nwadike I.N (1996). Igbo Contemporary Drama. Early Beginning, Bibliography, & Classification. Na Nsukka Journal of the humanities 9.114.

Nwadike, I.U (1998). Adaeze. Pacific Correspondent College & Press.

Okeke, J. N (2009): Oral Literature and Family: The Igbo eụample. N’Unizik Jounal of Art & Humanities 2. 180

Olá L, Richter R & Kotowska, I. (2014). The New Roles of Men & Women and Implications for Families & Societies. Families and Society. familiesandsocieties.univie.ac.at

Orjinta A.I. (2013, January 26). Womanism as a method of Literary Text Interpratation. A study of emergent Women’s Images & Religious Straucture in Selected Works of Henrich Bo11. Ludwig-Maximilians- Universitiat Munchen. https://edoc.ub.uni-muenchen.de.

Otiono, N. (2014). ‘Catherine Acholonu (1951-2014): The Female Writer as a Goddess’. Nokoko, 4, 67-89

Omware, K. (2019, February 25) Hiden Strengths: The Secret Power of Human Weakness. Medium. https://www.medium.com/@nextgenwritters

Shuani, A(2020, December 8). Roles of Women in the Family & Society. YourArticle Library. https://www.Yourarticlelibaray.com

Simeon, S. (2021, February 2). More Couples are Embracing Female Breadwinners, despite Decades of Old Stigmas. NPR. https://www.npr.org on.

Sundel, H. (2020, February 14). I’m the Breadwinner in my Relationship & it’s Complicated. Yahoo Life.https://www.yahoo.com/lifestyle

Sindell, T. & Sindell, M. (2015). Hidden Strength: Unleashing the Crucial Leadership Skills You Already Have. Berrett-Koehler

Downloads

Published

2025-01-27