EJIJE: ENYO E JI AHỤTA MMEGBU ỤMỤODIBO N’AKWỤKWỌ ERURU N’OGE UGBU A
Abstract
Ụmịedemede Etu mmadụ nwere ike were enyo hụta ihu ya, etu a ka e nwere ike jiri ejije hụta mmegbu ụmụodibo n’ala anyị n’oge ugbu a site na akwụkwọ Eruru. Mmegbu ụmụodibo bụ ihe jọrọ njọ nke ukwu ma n’ihu Chukwu ma n’ihu mmadụ. N’ihi ya, nchọcha a na-eleba anya n’ihe ndị na- ebute ịgba odibo, ụzọ dị iche iche e si emegbu ụmuodibo, dg. Nchọcha a gbadoro ụkwụ n’atụtụ ndoko nke Vladmir Prop. Atụtụ a kwadoro ndokọ ọnụ isiokwu na pụmpụtakwa dị n’agụmagụ ọdịnala. Ngwa nchọcha a bụ site n’akụkọ e dere n’akwụkwọ ejije Eruru, nakwa akwụkwọ ndị ọzọ metụtara isiokwu a. Nchọcha a chọpụtara na; Ụrịọnụ boro Eruru ebubo asị, tie ya ihe ma ziga ya ozi tara akpụ dg. N’ihi ya, ndụmọdụ anyị bụ ka ndị nlekọta ụmụodibo belata ahụhụ ha na -ata ụmụodibo dịka iti ha oke ihe, enyeghị ha nri, ibo ha ebubo dg. E nwere otu bụ “NAPTIP” (National Agency for Prohibition and Trafficking in Persons) nke gọọmenti guzobere ịhụ na atara ndị ọ bụla na-atụ mgbere ụmụaka mana-emegbukwa ha ahụhụ. A gana-akuzi maka nlekọta ụmụodibo ebe niile dịka na ntanetị, ihe onyoonyo televishọn na igwe okwu redio. Ọ dịkwazị mkpa ịkụzi maka nlekọta ụmụodibo na ọgbakọ ndị nne na nna, na na nke ndị nchekwa ndị ọzọ.References
Awosusi, O. & Adebo, G. M. (2012). “Domestic Servants and Rural
Youth Urban Migration in Nigeria”. Journal of Humanities and
Social Science. Vol. 2. No. 5.
Baum, W. (2005). Understanding Behaviourism: Behaviour, Culture and
Evolution. (2nd ed). Wiley: Blackwell.
Eke, J. G. I. (2001). Igbo-English Dictionary(Ọkọwa okwu). Enugu: New
Generation Books.
Engleton, T. (1976). Maxism and Literary Criticism. London: Metheum
Books.
Greiner, L & Schein, V.E. (1988). Power and Organisation Development.
Mobilizing Power to Implement Change. Alexandra: V. A.
Prentice Hall.
Igiligi, B & Ogenyi, S. (2002). Literature for Enjoyment: An Introduction
to Nature, Genress and Theories of Literature. Enugu: Computer
Edge Publishers.
Ikeokwu, E. S. & Onyejekwe, M. C. (2004). Mmalite Ọmụmụ na Nghọta
Ejije Igbo. Enugu: CIDJAP
Mbah, B. M. & Mbah, E. E. (2007). Azonye: Lecturers on Igbo Literature
and Stylistics. Nsukka:Universityof Nigeria Press.
Ngara, B. (1985). Arts and Ideology in the African Novel. London:
Heinemann.
Nwaozuzu, G. I. Eruru. Enugu: Format Publishers Nigeria.
Nwazuoke, A. N. & Igwe, C. A. (2016). “Worst Form of Child Labour in
Nigeria. An Appraisal of International and Local legal Regimes”.
Faculty of Law, Ebonyi State University, Abakaliki, Nigeria.
Nwadike, I. U. (1992). Ntọala Agụmagụ. Nsukka: Ifunanya Publishers.
Odilora, U. (1974).Ọkpa Akụ Eri Eri. Onitsha: University Publishing
Company.
Ogene, M. S. (2010). Literary Appreciation. Enugu: Noliu Educational
publications.
Okafor, E.E. (2010). “Child Labour Dynamics and Implication for
Sustainable Development in Nigeria”. Journal of Sustainable
Development in Africa. No. 5.
Okebalama, C. N. (2003). MkpọliteAgụmagụ lgbo. Enugu: SNAAP Press.
Ossai, M. N. (2016). “Ọnọdụ Ụmụodibo n’ỤfọdụIduuazi Igbo”. Akwụkwọ
ngụpụta Ph.D.e dere na Ngalaba Lingwiistiks, Mahadum Naịjirịa,
Nsụka.
Rachilin, H. (1991). Introduction to Behaviourism. (3rd ed.). New York:
Freeman.
Sweet, J. B. & Resick, O. (1979). “The Maltreatment of Children: A
Review of Theories and Research”. Journal of Social Issues. vol.
No. 35.
Watson, J. B. (1913). Behaviourism Theory.
https://en.wikipedia.org/wiki/John.Bwatson. Oge a gụtara:20/2/19