EBE A GA-AHỤ AKỤKỌALA NDỊ IGBO
Abstract
Ụmịedemede Akụkọala bụ akụkọ dị iche iche na-akọ maka ndụ agbụrụ, ọkachasị ihe megasịrị n’agbụrụ n’oge gboo, dịka etu agbụrụ ahụ siri malite, ndị dị iche iche kpara ike n’agbụrụ ahụ n’oge ochie, na ihe ndị ọzọ megasịrị n’agbụrụ ahụ. Akụkọala dị nnukwu mkpa na ndụ agbụrụọ bụla. N’ihi nke a, o kwesịrịna a ga-achọpụta ụzọ e si achịkọta ihe e ji ede akụkọala Igbo. Nchọcha a gosiri na e si n’ụzọ dị iche iche dịka n’akụkọ si n’aka nna fere n’aka nwa, amụmamụ gbasara ihe ọkpụe gwupụtara n’ala, lingwistiks na ihe ederede dị iche iche achịkọba akụkọala Igbo. Nsogbu bụnaụfọdụ usoro ndị a e si achịkọbaakụkọala ndị Igbo riri mperi dị egwu, nke a mere na enweghịnkwekọrịta n’etiti ndị Igbo otu ụzọ a ga-esi chịkọba akụkọala ha. Nsogbu ọzọ bụnaịgbaso otu n’ime usoro ndị a kpamkpam nwere ike iduhie ndị mmadụụzọ. A tụchara usoro nchịkọba ndịa iji mata usoro kasị mma onye Igbo ga-esi chọta nhibereisi akụkọala ya. Ngwaọrụ nchọcha a gbadoro ụkwụ n’akụkọọdịnala, ihe ọkpụ, asụsụ, tinyere ederede. Nchọpụta gosiri nantọala agbụrụọ bụla hibereisi n’akụkọala ha. Akụkọala na-enye aka ahazi ndụ agbụrụ mee ka ndị na-etolite etolite chekwaa ntọala ha, ma gbaa nnukwu mbọ ihibe ntọala bụọkaibe maka ọdịniihu n’ihi naonye amaghị ebe mmiri nọ mawa ya anaghị ama ebe ọ nọ kwụsị.References
Agbodike, C. C. (2008). “The Place of Igbo-Ukwu in the Socio-Cultural
and Economic History of the Igbo”. N’Onwuka,N. and Iwuagwu,
O. (ọhz.).Topics in Igbo Economic History.Lagos:First Academy
Publishers.
Anizoba,O. M. (2013). “Nke M Akọla M: Ndị Igbo na Asụsụ ha.”The 8th
Chief Dr. F. C. Ogbalu Memorial Lecture. Onitsha: Varsity Press.
Anozie, F. N. (2012). “Archaeology of Igboland: The Early Prehistory.
N’Ofomata,G. E. K. (ọhz.). A Survey of the Igbo Nation. Onitsha:
Africana First Publishers.
Dike, K. O. (1956).Trade and Politics in the Niger Delta. Onitsha:
University Press
Ekwealor, C. C. (1989). Omenala na Ewumewu ndị Igbo. Onitsha: Palma
Publishers.
Igbo,P. C. (2012). Elements of Igbo Culture and Tradition. Onitsha: Elite
Publishers.
Ijeoma,J. O. “ Igboland: A Historical Perspective”. N’ Ofomata, G. E. K.
(ọhz.). A Survey of the Igbo Nation. Onitsha: Africana First
Publishers.
Isidienu,I. C. (2016).“Nzipụta Ndụ ndị Igbo site n’AbụỌdịnala Ha.”
N’Okodo, I. (ọhz.). Odezuruigbo: An International Journal of
Igbo, African and Asian Studies. Awka: Apple Press.
Kanu,I. A. (2015).African Philosophy: An Ontologico-Existential
Hermeneutic Approach to Classical and Contemporary Issues. Jos:
Augustinian Publishers.
Madubuko, L. (1994). “Igbo world-Veiw”.Bigard Theological Studies.
Ogbalu, F. C. (2006). Igbo Institutions and Customs. Onitsha: University
Press.
Ogbalu, U. J. (2011). “Appriciation of Igbo Folktales and songs Versus
Realism.N’Agu. (ọhz.). Ujah. Unizik Journal of Arts and
Humanities. Awka: Fab Anieh.
Ogu, J. N. (1992). Creativity in Childrens Literature in Africa. Ibadan:
Heinemann.
Onwuejeogwu, M. N. (2007). The Social Anthropology of Africa: An
Introduction. Ibadan: Heinemann.
Orji, M. N. (1999). The History and Culture of the Igbo People before the
Advent of theWhite Man. Nkpor: Jet Publishers.
Osuji, C. (1984). “Are Igbos Herbrew?” Sunday Statesman, April 22,1984.
Shaw, T. (1967). “The Mystery of the Buried Bronzes-Discoveries at Igbo
ukwu,Eastern Nigeria” in Nigeria Magazine, No. 92, March, 1967.