ỊKỤ AKPARATA: AKWAMOZU NWAANYỊ N’OBODO ỌGWỤ

Authors

  • Anthonia Chinyere Ephraim-Chukwu Ngalaba Amụmamu Igbo, Afrịka na Eshịa Mahadum Nnamdị Azịkiwe, Ọka Steeti Anambara, Naịjirịa

Abstract

Ụmịedemede Ndị ọcha wetara ụka n’ala Igbo dakwasịrị n’omenaala Igbo, katọọ ya ma mebikwaa ọtụtụ n’ime ha. Nke a mere na imerime ndị ọgbọna-etolite ugbu a amaghị omenaala obodo ha, otu n’ime omenaala ndị ahụ bụ ịkụ akparata. Mbunuuche nchọcha a bụ ịchọpụta ma o nwere ajọ ihe a na - eme mgbe a na-akụ akparata n’akwamozu nwaanyị n’Ọgwụ mere ndị ụka ji machie ndị na-aga ụka ịgba egwu akparata. Ebe ọtụtụ n’ime omenaala Igbo nọzị n’ọnụ ọnwụ, ọ dị mkpa ka edepụta ha n’akwụkwọ ka ọgbọ na abịa n’ihu nwee ike gụọ ma matakwa omenaala ha. E mere nchọcha a bụ ịkụ akparata akwamozu nwaanyị n’obodo Ọgwụ iji hụ na otu n’ime omenaala a na-eme n’Ọgwụ dị na Steeti Enugwu efughị efu. Nke a ga eme ka ndị gụrụ akwụkwọ a mata na omenaala Igbo dị mma. Usoro agbasoro mee nchọcha a bụ usoro sọvee. Nwanchọcha gbara ndị mmadụ ajụjụ ọnụ site n’ogbe iri dị n’Ọgwụ. Ọ gakwara ebe a na-eme mmemme akwamozu nwaanyị lelee ka esi agba egwu akparata nakwa mmemme niile a na-eme tupu a kụọrọ ndị na-akwa nne ha akparata. Site n’ihe ndị agbara ajụjụ ọnụ zara, a chọpụtara na o nweghị ajọ ihe ọbụla a na -eme n’ịkụ akparata. Ọ bụ mmaja ka a na-amaja ndị akwaghị nne ha ka ha wee gbaa mbọ kwaa nne ha maka na nkwenye ndị Igbo, ozu akwaghị akwa na akwụgharị na amanri mmụọ na mmadụ na-achọ onye ọ ga-ememila.

References

Achebe, C`. (1958). Things fall apart. Ibadan: Heinemann.

Achebe, C. (1964). Arrow of God. Ibadan: Heinemann.

Agbasiere, J. T. (2000). Women in Igbo life and thought. London: Frankass.

Basden, G .T (1921).Among the Igbos of Nigeria. London: Frankass.

Booth, S. & Newell, A. (1977).A Symposium: African religion. New York: NOK

Publishers.

Mbiti, J.S (1975). Introduction to African religion. London: Heinemann.

Ogbalu, F.C.(1979). The book of Igbo customs. Varsity Press: Onitsha.

Osuagwu, B. I. N. (1979). Ndị Igbo na omenaala ha. Ibadan: Macmillan.

Parrinder, E. G. (1976). African traditional religion. London: Sheldon.

Ubesie, T. U. (2004). Ọdịnaala ndị Igbo. Ibadan: Oxford University Press.

Downloads

Published

2025-01-27