NDEHIE “NA”: ILEBA ANYA N’EDEMEDE ỤMỤAKWỤKWỌ ALVAN IKOKU FEDRAL KỌLEEJI KEEDUKESHỌN, OWERE

Authors

  • Florence Ọlachi Okere Ngalaba Amụmamụ Asụsụ Ala Naịjirịa na Lingwistiks, Alvan Ikoku Fedral Kọleeji Keedukeshọn, Owere, Naịjirịa

Abstract

Ụmịedemede Nchọcha a bụ maka ndejọ ‘na’ n’ụtọasụsụ Igbo n’ebe ụmụakwụkwọ ógó NCE (Nigerian Certificate in Education), Ngalaba Amụmamụ Asụsụ Ala Naịjirịa na Lingwistiks, Alvan Ikoku Fedral Kọleeji Keedukeshọn, Owere. Mbunuche nwa nchọcha bụ ịchọpụta ebe ụmụakwụkwọ ndị a na edejọ ‘na’ n’ụtọasụsụ Igbo, ọrụ dị iche iche ‘na’ na-arụ n’ahịrịokwu. Nchọcha a gbasoro usoro sọvee. E jiri ụmụakwụkwọ ọnụọgụ ha dịiri ise mee nchọcha a, ndị gụnyere ụmụnwaanyị iri anọ na ise, na ụmụnwoke dị ise. Ha dum dere ihe nnwale e nyere ha n’ozuzu òkè. Ndehie ‘ na’ n’ebe ụmụakwụkwọ ndị a nọ kpaliri mmụọ nwa nchọcha ịhọrọ isiokwu a. Nwa nchọcha gbasoro atụtụ ntụcha ndejọ wee mee nchọcha a. A chọpụtara na ihe ndị na-ebutekarị nramaahụ a gbasara odide ‘na” bụ a kpachapụrụghị usoro odide ụtọasụsụ Igbo anya nke ọma, nleghara anya, ndụ ọgbasaghịm nakwa a maghị nke ekwe na-akụ n’ihe gbasara ndetali asụsụ Igbo. Na nnyocha e mere, a chọpụtara na ụmụakwụkwọ ndị kacha dejọọ ‘na’ n’ederede nnwale nta ahụ bụ ndị N.C.E. II, ebe ndị mekarịsịrị nke ọma bụ ndị N.C.E.III. N’ikpeazụ, nwa nchọcha tụrụ aro ka ụmụakwụkwọ nọgasị n’ụlọakwụkwọ dị elu na Ngalaba Amụmamụ Asụsụ Igbo, ndị sekọndịrị nakwa praịmarị jisie ike mụta ka e si ede ‘na’ nke ọma dịka mgbe ọ na arụ ọrụ mbuụzọ, njikọ,nnyemakangwaa na isingwaa. Nke a ga-eme ka odide na ọgụgụ asụsụ Igbo dị mfe

References

Akidi, F.C. (2016). “Error analysis”. Na Mbah,B.M. (ọhz.) Theories of

linguistics. Enugu: University of Nigeria press.

Anedo, O.A.A. (2014). Ndehie n’ide asụs ụ Igbo na ụ fọdụ ihe ọmụmụ

ụtọasụsụ Igbo. Awka: Besing books multipurpose publications.

Apakama, L.M. (2002). Introduction to Igbo parts of speech. NaNigerian

languages for colleges of education. Owerri: Cajec publishers .

ihu 8-19.

Echebima, G. (2013). A textbook of Igbo grammar. Owerri: Assumpta

press.

Emenanjọ, E.N. (1991). Nchịkọta asụsụ na ụtọasụsụ Igbo izugbe maka

sekọndịrị. Lagos: Longman Nigeria plc.

Emenanjọ, E.N. (2010). “The expression of prepositional notions in

Igbo”. Na Uchechukwu, C&Mbah, B.M. (ọhz.) Igbo language

studies series I.The preposition in Igbo. Onitsha: Edumail

publication. ihu 5-13.

Etherton, A.R.B. (1976). “Error Analysis: problems and procedures”.

English language teaching journal. Vol. 31-32; ihu 69-74.

Egeọnụ, N.G. (2015). “A referential theory of meaning”. Na Mbah, B.M.

(ọhz.). Theories of linguistics. Enugu: University press.

Eyisi, J. (2006). Grammar of English: The student’s companion.

Anambra: Rex Charles publications.

Ezema, T.O (2012). Nkuzi ụdaasụsụ Igbo. Lagos: Unique press.

Ezeomeke, S.O. (2011). Igodo nghọta ụtọasụsụ Igbo. Enugu: Easy –

quality press.

Hornby, A.S. (2015). Oxford advanced learners dictionary of current

English (9th ed). London: Oxford university press.

Ike, N.J. (2007). Applied linguistics. Abuja: Wilbest educational publishers.

Ilechukwu, D.I. (2016). “Nganusoro n’asụsụ Igbo” Akwụkwọ ngụpụta

PhD e dere na Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka na Eshịa, Fakọlti

keatị Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka.

Izuagba, A.C. (1998). “Error analysis: A realistic approach to second

language teaching and learning”.N’Ikediashi, A.E & Anyanwu,

S.U.(ọhz.). Fundamentals of teaching and learning methodology.

Owerri: Capes publishers.

Mbah, B.M.& Mbah, E.E. (2014). Atụtụ amụmamụ asụsụ. Enugu:

University of Nigeria press.

Mbah, B.M. (2010). “Category incorporated preposition in Igbo”.

N’Uchechukwu, C&Mbah, B.M. (ọhz). Igbo language studies

series I. The preposition in Igbo. Onitsha: Edumail publication.

ihu 26-45.

Mbah, B.M. (2017). Nkuzi o nyere ndị PhD na ngalaba amụmamụ Igbo,

Afrịka naEshịa, Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka.

Mbah, B.M. na ndị ọzọ (2013). Igbo adịIgbo-English English-Igbo

dictionary of linguistics and literary terms. Enugu: University of

Nigeria press.

Ọfọmata, C.E. (2013). Ndezu ụtọasụ sụ Igbo. Usoro nkuzi na ọmụmụ nke

UBE nke ndị junịọ sekọndịrị. Enugu: Format publishers.

Okeke, C.O. (2010). “Lexicographic problems of the Igbo preposition”.

N’Uchechukwu, C& Mbah, B.M. (ọhz.). Igbo language studies

series I.The preposition in Igbo. Onitsha: Edumail publication.

ihu 66-87.

Okoro, L.C. (2011). Mkpanaka onyekuzi. Owerri: Ark publishers.

Okafọ, C.U & Ewelukwa, U. (2012). Nhazi asụsụ Igbo maka ule sinịọ

sekọndịrị na kọleji, W.A.S.S.C.E, N.E.C.O, G.C.E, J.A.M.B.

Onitsha: A.C. global publishers.

Saeed, J.I. (2006). Semantics. Oxford: Blackwell publishing.

Uchechukwu, P.A. (2010). “The realizations of the Spanish preposition

‘a’ in Igbo”. N’Uchechukwu, C&Mbah, B.M (ọhz.) The

preposition in Igbo. Onitsha: Edumail publication. ihu 124-135.

Ume, I.A.O., Ugoji, J.U & Dike, G.A. (2006). Umị nkọwa ụtọasụsụ Igbo.

Owerri: Ark publishers.

Downloads

Published

2025-01-27