OSISI NKWỤ : NGWAA NA AHA NDỊ GBASARA YA

Authors

  • Felista Chidị Akịdị Directorate of General Studies Federal University of Technology, Owerri, Naịjirịa
  • Chiọma RoseMary Ayọzie Directorate of General Studies Federal University of Technology, Owerri, Naịjirịa
  • Andrew Chukwuemeka Mgborogwu Directorate of General Studies Federal University of Technology, Owerri, Naịjirịa
  • Grace Ngozi Amajioyi Imo State College of Education, Ihitte Uboma, Naịjirịa

Abstract

Ụmịedemede N’ihi oke mmepe na nnabata nkanụụzụ n’ime omenaala Igbo, ọ na-adịzị ka a na-eleghara nkwụ anya. E chefuru na ndị Igbo chọpụtara uru nkwụ bara site na mbụ. Ndị Igbo chọpụtara ihe ọma na uru niile gbasara nkwụ tupu nkanụụzụ ọlọrọọhụrụ. E chefuru na site na nkwụ, e nwere ike inweta ọrụ, ego, ihe oriri, ̣ọgwụ na ihe ndị e ji arụpụta ihe ndị ọzọ bara uru. Nleghara anya a na-eleghara nkwụ mere na ọ dịzi ka ụfọdụ ihe gbasara nkwụ enweghị aha maọbụ ngwaa e ji ezipụta ha n’Igbo. Nsogbu a bụ ihe kpalitere nchọcha a. Mbunuuche nchọcha a bụ ịkọwapụta uru si na nkwụ, idepụta ngwaa na aha ihe gbasara nkwụ, iji ngwaa ndị a mee ahịrịokwu na ịkọwa aha ndị e depụtara gbasara nkwụ. A chọputara na ihe niile gbasara nkwụ nwere mkpụrụokwu e ji ya ekwu n’ihina ndị Igbo bidoro na gboo chọpụta nkwụ na uru ya niile. A tụrụ alo ka agbụrụ na-amachaghị ihe gbasara nkwụ mụrụ n’aka ndị Igbo ihe gbasara nkwụ ma sitekwa n’aka ndị Igbo biri okwu gbasara nkwụ iji mejuo nke ha.

References

Ezeuko, R.O. (1986). Ewumewu, omenala, ofufe na nkwenye ndị Igbo.

Onitsha: Etukokwu

Igbokwe, B.N. (2012). “Osisi nkwụ na uru ya n’obodo Mbieri”. N’Ọja

international journal of Igbo, African & Asian Studies. mbipụta

mbụ, ihu 46-49.

Ilechukwu, D.I. (2017). “An English-Igbo translation of palm tree production

and processing terms for human development”. N’Unizik

journal of Arts and humanities(UJAH) special

editionhttp://www.ayol.info/indeụ.php/ujah/indeụ pp 145-162.

Maduekwe, J.C. (1979). “Osisi na-amị ego”. N’Ekechukwu, R.M. (ọhz)

Akpa uche (Anthology of modern Igbo verse). Ibadan: University

press, ihu 24-25.

Ubesie, T. (1979). “Nkwụ”. N’Emenanjo, E.N. (ọhz) Ụtarantị akwụkwọ

abụ Igbo. Ibadan: Evans Brothers.

Uchendu, M.E. & Opara, R.U, (2014). “Palm Shoot (ọmụ) Symbolism in

Igbo tradition society”. Ọkpụlọ journal of arts and cultural

heritage. ISSN: 2384-6720, Vol. 1. Ihu 34-40.

Downloads

Published

2025-01-27