ỌDỊDA ILU IGBO NA SENCHURI NKE IRI ABỤỌ NA OTU
Abstract
Ụmị edemede Edemede a bụ maka ọdịda ilu Igbo na senchuri nke iri abụọ na otu. Ihe nwanchọcha bu n’obi bụ ịchọpụta ma detuo ọnọdụ ọjọọ e tinyeghi ilu Igbo n’okwu Igbo nọ na senchuri nke iri abụọ na otu. Ihe kpalitere nwanchọcha ime nchọcha n’isiokwu a bụ na etu ndị mmadụ si etinye ilu Igbo n’okwu Igbo n’oge ochie abụghị etu ọ dị n’oge ugbu a. N’agbanyeghi mgbanwo ọjọọ dị etu a, o nwebeghi onye merela nchọcha ime ka uche ndị mmadụ rute n’ebe ahụ. Nwanchọcha gbara mbọ lechighaa anya azụ mgbe ezi dị n’ukwu ụkwa, were gosipụta na ọ bụ ilu Igbo bụ uwe ebube asụsụ Igbo yi were apụta n’ọgbọ. Nke a mere na ụmụaka na kwa ndị okenye na-agba mbọ mụta ilu Igbo ma were ya naekwu okwu oge ọbụla n’ebe o kwesiri. O wepụtara uru dị egwu nke a wetara maka asụsụ Igbo. N’agbanyeghi ihe ndị a, mgbanwo ọjọọ pụtara na senchuri iri abụọ na otu bụ na ọtụtụ ụmụafọ Igbo anaghị etinye ilu Igbo n’okwu mgbe ha na-asụ asụsụ Igbo. Nwanchọcha chọpụtara ọghọm ọnọdụ dị etu a nwere ike ibute, ma tụpụtakwuazi atụmatụ etu e nwere ike isi gbochie ya bụ ajọ ọnọdụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị a: Ndị Igbo ga-ebugodu ụzọ hụ asụsụ Igbo n’anya ma were ya na-eme ọnụ; ndị nne na nna ga-agba mbọ na-ewepụta oge maka ọzụzụ ụmụaka n’ezinaụlọ ha dị iche iche. Ndị gọọmenti na ndị ọzọ agụmakwụkwọ dị n’aka ga-agba mbọ na-achịkọba asọmmpi nrụrịta ụka n’ogo dị iche iche n’ụlọakwụkwọ ndị dị n’ala Igbo na kwa ebe ndị ọzọ ndị Igbo bi.References
Achebe, C. (1958). Things fall apart. New Hampsphere: Heinemann.
Anugom, O.A. (2010). Ahụ mmadụ: Nsọpụrụ kwesiri ya. Owerri:
Odenigbo Lectures.
Arinze, F. A. (1979). Sacrifice in Ibo religion. Ibadan: University
of IbadanPress.
Basden, G. T. (1921). Among the Ibos of Nigeria. Onitsha:
University Publishing Company.
Chukwu, C. (2014). Igbo oratory. Enugu: ABIC Books & Equip.
Davids, P. K. (1980). Ilu Igbo – N’ime Igbo (The text book of Igbo
proverbs). Onitsha:University Publishing Company. Echebima,
G. (2015). A textbook of Igbo linguistics. Owerri: Assumpta
Press.
Edeh, E. M. P. (1985). Towards an Igbo metaphysics. Chikago:
Loyola University Press.
Ejiofo, P. (2015). Ajọ ọrịa ji asụsụ Igbo: Okenye ịnọ n’ụlọ ewu na-amụ
n’ọgbịrị. Awka: Valid Publishng Company.
Ezema, T.O. (2012). Nkụzi agụmagụ ọdịnaala Igbo. Kotangora:
Victory Press.
Igbo, P.C. (2012). Elements of Igbo culture and tradition. Onitsha:
Goodmark Printers.
Kanu, I, A. (2015a).African philosophy: An ontologico-existential
hermeneutic approach to classical and contemporary issues. Jos:
Augustinian.
Kanu, I. A. (2017). “Sources of igwebụike philosophy: Towards a
socio-cultural foundation”. N’ International Journal of Religion and
Human Relations. Vọl.9 nọ 1: 1-23.
Mbah, B. M. & Mbah, E. E. (2007). Azụonye: Lectures on Igbo literature
and stylistics. Nsukka: University of Nigeria Press.
Mbiti, J. S. (1970). African religion and philosophy. Nairobi: East
African Educational Publishers.
Nwadike, I.U. (1981). Ntọala na nnyocha ọgụmagụ. Ihiala:
Deo GratiaPublishers.
Nwadike, I.U. (2009). The Igbo proverbs-A wider perspective. Nsukka:
PascalCommunications
Nwala, T.U. (2010). Igbo philosophy – The philosophy of Igbo
speaking people. New York: Triatlantic Books.
Obiechina, E. (1975). Culture, tradition and society in the West
African novel. Cambridge:Cambridge University Press.
Ofomata, Ch. E. (2004). Ndezu ụtọasụsụ Igbo nke ndị siniọ sekọndịrị.
Enugu: Format Publishers.
Ofomata, C. E. (2016). Nsirinweta ilu Igbo (Ilu Igbo, nkọwa ya
na nsirinweta ya). Enugu: Goldfinger Publications.
Okafor, R. C. & Osondu, S. I. (2013). Ilu ndị Igbo. Enugu:
Academic Publishing Company.
Olugbamigbe, Y.S. (2003). “Four decades in the study of language and
linguistics in Nigeria”. N’Ozo-Mekuri Ndimele (ọhz.). A
festschrift for Kay Williamson. Aba: National Institute for
Nigerian Languages.
Umezi, P. I. (2005). Ọba ilu Igbo. Enugu: Oktek Pub.