“MWEPỤ” N’ỤTỌASỤSỤ NNWOGHARỊ

Authors

  • Thecla Ngọzị Udemmadu Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka na Eshia Mahadum Nnamdị Azịkiwe, Ọka, Naịjirịa
  • Nkiru Ugwu Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka na Eshia Mahadum Nnamdị Azịkiwe, Ọka, Naịjirịa

Abstract

Ụmịedemede Nchọcha a nke isiokwu ya bụ “Mwepụ n’ỤtọasụsụNnwogharị” lebanyere anya n’ọnọdụ mwepụ dịka otu n’ime agba mgbanwe n’ahịrịokwu Igbo ga. Mwepụ bụ mgbanwe n’ụtọasụsụ nke na- eme ka okwu dịbu n’agba ala pụọ ma mee ka ọ ghara ịpụta ihe n’agba elu ahịrịokwu ahụ. Atụmwepụn’ụtọasụsụ nnwogharị gụnyere: ntimiwu, mbugharị nnara na orite na kwa mwepụ site n’oyiyi. Nchọcha a bu n’uche ịchọpụta ụdị mwepụ dị iche iche e nwere n’ụtọasụsụ Igbo na kwa ọnọdụ ha n’ebe ụtọasụsụ Igbo dị. Nchọcha a gbara mbọ iji ọmụmaatụ doro anya zipụta ụdị mwepụ atọ ndị ahụ dị iche iche n’ahịrịokwu Igbo ga, ma lebakwaa anya na nkebiahịrị kenkọwa ma kọwaa ụdị ya abụọndị bụ ahịrịisi na ahịrịnkwọ. Nchọcha a nwetara ngwa nchọcha ya site n’edemede nchọpụta dị iche iche ndị odeederela. Nchọcha a chọpụtara n’ezie na e nwere ụdị mwepụ atọ kpọmkwem n’ụtọasụsụ nnwogha Igbo. N’ikpeazụ, nchọcha a site na nchọpụta ya kwenyere na ụmụ akwụkwọ ngalaba sayensị asụsụ ga-esite na ya mata ihe omimi banyere mwepụ na kwa ọnọdụ ya n’ebe ụtọasụsụnnwogharị dị.A tụziri aro ka ndị nchọcha n’ọdịniihu lebanyekwuo anya n’isiokwu nchọcha a iji chọpụta ihe ndị ọzọ nchọcha a achọpụtaghị banyere isiokwu a

References

Agbedo, C.U.(2000). General linguistics: An introductory reader. Nsukka

ACE Resources Konsult.

Anagbogu, P.N, Mbah, B.M., & Eme, C.A (2010). Introduction to

linguistics. Awka: Amaka Dreams.

Chomsky, N. (1957). Syntactic strucures. Mouton: The Hague.

Emenanjo, E.N (1978). Elements of modern Igbo grammar. Ibadan:

Oxford University Press.

Jackendoff, Ray (1977). X-Bar syntax: A study of phrase structure.

Cambridge: MIT Press.

Mbah, B.M. (2012). GB Syntax: A minimalist theory and application to

Igbo. Enugu: CIDJAP Press.

Mbah, B.M&Mbah, E.E (2014). Atụtụ amụmamụ asụsụ. Nsukka:

University of Nigeria Press.

Ndimele, O. M. (1991). A first course on morphology and syntax. Port

Harcourt: Emhai Printing and Publishing.

Newton, G. (2011). “Accounting for do-support postsyntactically.Evidence from Irish”. Proceedings of the 32ndannual

Pennsylvanian linguistics colloquim, Vol.15. Pennyslyvania:

University of Pennsylvanian press,ihu 163-172.

Nwala, M.A. (2004). Introduction to linguistics: A first course. Abakiliki:

Wisdom Publishers.

Nwala, M.A (2004). Introduction to syntax: The students’guide. Abakiliki:

Wisdom Publishers.

Ọnwụdiwe, G. (2015). Nkụzị ndị afọ nke anọ na Ngalaba Amụmamụ

Igbo, Afrịka na Eshịa, Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka.

Udemmadụ, T.N. (2014) Nkụzi na Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka na

Eshịa, Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka.

Waya, D.T. (2010). “Deletion in Tiv: A transformational analysis.”

Akwụkwọ Ngụpụta maka nzere MA, Ngalaba Linguistics, Igbo na

asụsụ Naịjirịa ndị ọzọ, Mahadum Naịjirịa, Nsụka.

Downloads

Published

2025-01-27