MMETỤTA ASỤSỤ BEKEE NA-EMETỤTA NKUZI NA ỌMỤMỤ ASỤSỤ IGBO NA SINỊỌ SEKỌNDỊRỊ N’OKPURU ỌCHỊCHỊ IGBO ETITI, STEETI ENUGWU

Authors

  • Christian E. C. Ogwudile (PhD) Ngalaba Amụmamụ Asụsụ Igbo na Eshia Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka
  • Chimankpam Juliet Didiugwu Ngalaba Ọmụmụ Asụsụ Igbo nke Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka dị na KọleejiKeedukeshọn (Tekinịkal), Steeti Enugwu

Abstract

Ụmịedemede Nchọcha a lebara anya na mmetụta asụsụ Bekee na-emtuta nkuzi na ọmụmụ asụsụ Igbo n’ụlọ akwụkwọ Sịnịọ Sekọndịrị dị n’okpuru ọchịchị Igbo Etiti nke Steeti Enugwu. E jiri usoro sovee mee nchọcha a. Nwa nchọcha jiri ajụjụ ederede nke isi ya bụ mmetuta asụsụ Bekee na-emetuta nkuzi na ọmụmụ asụsụ Igbo n’ụlọ akwụkwọ Sịnịọ Sekọndịrị dị n’okpuru ọchịchị Igbo Etiti nke Steeti Enugwu wee mee nchọcha a. E jiri usoro nsere họpụta ụlọ akwụkwọ iri n’etiti ụlọ akwụkwọ Sekọndịrị dị iri asatọ na ise e nwere n’okpuru ọchịchị Igbo Etiti. Ndị e jiri mee nchọcha a bụ ụmụ akwụkwọ ọnụọgụ ha dị narị abụọ ndị nọchitere anya ụmụ akwụkwọ ọnụọgụ ha dị otu puku na narị iteghete. Ndị nchọcha haziri ihe ha chọpụtatra site n’usoro miini. Ihe a chọpụtara gosiri na asụsụ Bekee na - emetuta nka ụmụ akwụkwọ gbasara ịsụ na ide asụsụ Igbo. Ọ na-emetuta akparamagwa ndị nne na nna ụfọdụ gbasara mmụta ụmụaka n’ebe ọmụmụ asụsụ Igbo n’ụlọ akwụkwọ dị. Ọ na-emetụtakwa izuoke ngwa nkuzi asụsụ Igbo n’ụlọ akwụkwọ. Ndị nchọcha tunyere aro ndị a: gọọmenti gaewebata ezigbo akwụkwọ ọgụgụ ndị e jiri Igbo izugbe depụta. Ndị nkuzi na ndị isi ụlọ akwụkwọ ga na-agba ụmụ akwụkwọ mere nke ọma n’ọmụmụ asụsụ Igbo ume dị ka inye ha ohere agụmakwụkwọ n’efụ. Ọzọ dị ka ibe ya bụ na ndị nne na nna ga na-eji asụsụ Igbo azụlite ụmụaka ha. Tinyere nke a, ndị gọọmenti ga na-achịkọba ọgbakọ ọzụzụ dị iche iche iji nye ndị nkuzi ọzụzụ pụrụ iche n’asụsụ Igbo. Na nchịkọta, ndị gọọmenti kwesiri ime ka ọ bụrụ iwu na tupu e were nwaafọ Igbo ọbụla n’ọrụ na ọ ga-abụ onye maara asụ ma na-edekwa asụsụ Igbo nke ọma

References

Agbedo, C. U. (2000). General Linguistics and Introductory Reader.

Nsukka: ACE Resources Consult.

Agbedo, C. U. (2003). Language and Mind. Nsukka: ACE Resources

Consult.

Anozie, C.C. (2003). Igbo Kwenu; Akụkọ na Omenaala ndị Igbo. Enugu:

Computer Edge Publishers.

Ene, O.I. (1999). “Influence of Levels of Education on Code Mixing

among Igbo-English Speakers”.Nchọcha M.Ed. Ngabala

Curriculum Studies and Education Technology. Mahadum Port

Harcourt

Hassanpour, (2001). “The Political Linguistics and Linguicide”Na

Robert Phillipson (ọhz.) Rights to Language Equition Igboanusi, H. (2002). Igbo English in Nigeria Level. Ibadan: Enicrownfit

Publisher.

Lado, R. (2008). Linguistics Cross Cultures Ann. Abbor: University of

Michigan Press.

Mba, E.E. (2007). Elison in Igbo Language and Literature in a

Developing Country. Onitsha: African First Publishers

Mgbodile, T. O. (1987). Dynamics of Reading Development in Early

Childhood Education. Meks-Uniove (Nig) Publishers.

Nwadike, I. U. (2002). Igbo Language in Education: A Historical Study.

Obosi: Pacific Publishers.

Okeke, B. S. (1985). A Handbook on Education Administration. Owerri:

New African Publishers.

Okorji, B. I. (1998). Aspect of Tonoloji in Umuchu Dialect. A Syntatic

Appraisal. Nsukka: Humanal of the humanity.

Okoye, B. (1995). “Attitude of Urban and Rural Senior Secondary

School Students towards Mathematics”.Journal of Quality

Education, 1.58-62.

Okpala, C. E (1990). Issues in Nigeria Education. Aba: Span Publishers.

Oraka, L. N. (1983). The Foundations of Igbo Studies. Onitsha:

University Publishers.

Orjime, D. S. (2003). “Language and the Survival of Democracy in

Nigeria”.FASS Journal of Faculty of Arts Seminar Series.

Makurdi: Benue State University.

Osuala, E. C. (1992). Introduction to Research Methodology. Onitsha:

Africana Feb. Publishers.

Ugwu, E. I. (2013). “Reciprocal Interferences in Bilingual English –Igbo

Speaking Society: The Implication in Language Pedagogy”.

International Journal of Social, Management, Economics and

Business Engineering.

Ugwu, T.C. (2006). “Effects of Use of Instructional Materials in the

Teaching and Learning of Literature in Senior Secondary School

in Igbo–Etiti Local Government Area”Nchọcha B.Ed. Mahadum

Naịjirịa, Nsụka.

Ukeje, B.O. (1976). Education for Social Reconstruction. London:

Macmillan Education.

Uzoezie, R.U. (2001). The Future Status of the Igbo Language in the

Emerging Polyglossic Speech Community, a Speculation.

Akwụkwọ Ngụpụta na 10th Annual Conference and general

meeting of the Modern Language Association of Nigeria at the

Nigeria French Language village, Badagri, Lagos ihu 7

Downloads

Published

2025-01-27