MBỤRỤ: NTỌALA ASỤSỤ N’AMỤMAMỤ ASỤSỤ NCHEKE
Abstract
Ụmịedemede Nchọcha a lebara anya na mbụrụ dịka ntọala asụsụ n’amụmamụ asụsụ ncheke.Ihe kpalitere nchọcha a bụ ịnụ ọkụ n’obi ọ na-anụ nwanchọcha ime ka ndịmmadụ mata na ọ bụ etu ngwaa siri baa uru n’ọmụmụ asụsụ Igbo ka mbụrụ siri baa uru n’amụmamụ asụsụ ncheke. Ihe nwa nchọcha bu n’obi bụịchọpụta mbụrụ etu o si metụta ntọala asụsụ n’ebe amụmamụ asụsụ ncheke dị. A gbasoro atụtụ njireme na atụtụ ncheke wee mee nchọcha a. Nka nwanchọcha jiri mee nchọcha a bụ nchọcha e dere ede dịgasị n’akwụkwọ ndị ahaziri maka amụmamụ asụsụ nakwa akwụkwọ dị n’ọba akwụkwọ dịgasị n’ụlọ akwụkwọ dị elu. Ka e mechara nchọcha a, a chọpụtara na mbụrụ dịka ntọala asụsụ n’amụmamụ asụsụ ncheke bụ ihe oke ọnụ ahịa n’ebe amụmamụ asụsụ dị. Okwu mbụrụụfọdụ na-enwe echiche miri emi n’ihi na haanaghị egosicha echiche n’ụzọ kwụọtọ. A na-ejikarị ihe nhụrụnuche were atụnyere ihe nhụrụnanya. A chọpụtara na mbụrụ bụ otu n’ime ihe ọmụmụ n’amụmamụ asụsụ ncheke nke na-esikarị ike na nghọta mana site n’ihe mmadụ mabu, nwaafọ asụsụọbụla na-aghọta ya n’egbughị oge.Nwanchọcha chọpụtakwara na mbụrụ na-egosi okwu ekereuche na-enye okwu nghọta pụrụ iche n’amụmamụ asụsụ ncheke. Nke a gosiri na mbụrụọbụla na-emetụta ekereke echiche nke na-adabado na nhụrụnanya nye nhụrụnuche.Na mmechi, aro nwanchọcha na-atụpụta bụ; ka enye ụmụafọ Igbo ndị nwere mmasị n’amụmamụ a agụmakwụkwọ n’efu. Ọzọkwa, ide ọtụtụ akwụkwọọgụgụ maka atụtụ amụmamụ asụsụ ncheke n’asụsụ Igbo dị oke mkpa.References
Fauconmier, G. (1985). Mental spaces. Cambridge: MA: MIT Press. Halupka-Resetar, S. &
Radic, C. (2003). “Animal names used in addressing
people in Serbian”. Journal of pragramtics, vol. 35, 190 – 199.
Lakoff, G. & Johnson, M. (1980). Metaphors we live by.Chicago: University of Chicago Press.
Lakoff, G. (1987). Women, fire and dangerous things; what categories reveal about the
mind.Chicago: University of Chicago.
Mbah, B. M & Edeogu, P. N. (2012). “The semanties of the verb – ‘se’: A congnitives
semantic study”. International Institute of Science, Technology and Education, 2.41 –
Mbah, B. M., Mbah, E. E., Ikeokwu, E. G., Okeke, C. O., Nweze, I. M., Ugwuona, C. N.,
Akaeze, C. M., Onu, J. O., Eze, E. A., Prezi, G. O., & Odii. C. (2013). Igbo adi. IgboEnglish English-Igbo dictionary of linguistics and literary terms.Nsukka:University of
Nigeria Press.
Mbah, B. M. & Mbah, E. E. (2014). Atụtụ amụmamụ asụsụ Igbo.Nsukka:
University of Nigeria Press.
Mbah, B. M. (2017) . “Nkụzi n’ihe ọmụmụ cognitive linguistics”. Ngalaba amụmamụIgbo,
Afrịka na Eshia, Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka
Ọfọmata, C. E. (2002). Ndezu ụtọasụsụ Igbo nke ndị junịọ sekọndịrị. Enugu:
Format Publishers.
Okonkwo, M. N. (1980). A complete course in Igbo grammar. Ibadan:Macmillian Nigeria
Publishers. Radden, G. (1999). “How metonymy are metaphors?”Na Barcelona (ọhz.),
Metaphor and metonymy at the crossroads.Berlin: Mounton de Gruyter.
Talmy, L. (2000). Towards a cognitive semantics.Cambridge: MIT Press.
L. (2004). Proper names and theory of metaphors.Cambridge:
Cambridge University press.