ALỤMALỤ NDỊ IGBO: ỤDỊDỊ NA ỌNỌDỌ YA N'OGE UGBUA

Authors

  • Joy Onyinye Onuegbu Ngalaba Igbo, Afịrịka na Nzikọrịtaozi Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka
  • Ifeyinwa Cordelia Isidienu PhD Ngalaba Igbo, Afịrịka na Nzikọrịtaozi Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka

Abstract

Ụmịedemede: Alụmalụ bụ otu n'ime nnukwu omenala gazuru ụwa niile ọnụ. Ọ bụ njikọta a na-ejikọ nwoke na nwaanyị ka ha bụrụ otu dịka di na nwunye. Ọ bụ site na mmekọ dị n'etiti di na nwunye ka mmadụ si abawanye n’ọnụọgụ. N'oge ugbu a, ọtụtụ ndị lụrụ di na nwunye na-enwe nsogbu dị iche iche nke na-ebute ịgba alụkwaghịm, esemokwu na nsogbu ndị ọzọga. Ebumnobi nchọcha a bụ ịchọpụta alụmalụ dị iche iche e nwere n’ala lgbo, ọnọdụ ha n'oge gboo na n’oge ugbu a, nsogbu si na ya apụta n'oge ugbu a, tinyere ihe a ga-eme ka alụmalụ ndị lgbo wee kwudosie ike. E nyochara ọtụtụ akwụkwọ metụrụ aka n’ihe ndị odee dere gbasara isiokwu a. E sitere n’ajụjụ ọnụ a gbara wee chịkọta ihe e ji mee nchọcha a. A chọpụtara na ọtụtụ ihe na-eweta nsogbu n’alụmalụ bụ anyaukwu na-esite n’ebe ụfọdụ ndị nne na nna nọ, oke ọchịchọ, mpako, ya na mmadụ etozughi etozue wee banye n’alụmalụ. Nchọcha a ga-enyere ndị ntorobịa na ndị nọ n'ime alụmalụ ugbu a aka ịmata usoro ha ga-agbaso iji gbochie esemokwu nke nwere ike ibute ịgba alụkwaghịm na-adapụtakarị n'etiti di na nwunye maọbụ ndị nwunye. Ndị ntorobịa chọrọ ịbanye n'alụmalụ ga-agba mbọ hụ na ha tozuru ihe e ji mmadụ eme tupu ha awụbanye na ya iji gbanahụ ebili mmiri dị n'ime alụmalụ. Alụmalụ dị nnukwu mkpa na ndụ ndị Igbo n’ihi na ọ bụrụ na e nyeghị ya ezi nchekwa, ị mara na ọtụtụ ezinaụlọ ga na-anọ n’ọgbaaghara oge dum.

Author Biography

Joy Onyinye Onuegbu, Ngalaba Igbo, Afịrịka na Nzikọrịtaozi Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka




References

Edensibịa

Dureke, J.A. (1964). Ememme ndị Igbo. Ibadan: Evans Brothers.

Hofstede, G. (1984). National, cultures and corporate cultures in L.A

Samover & R.E Poter (Eds).

Isidienu, I. C. (2016). “Igbo traditional marriage customs and values.” N’Umezinwa, E. C, Nwadialor, K. L. et al. Humanities and African values. Awka: Fab Anieh Publishers. ISBN: 978 -978 – 8454-30-13

Kottak. C. P. (2009). Cultural anthropology. New York: M C Graw. Hill.

Nzeakor, J.U.T (1979). Omenala ndi Igbo. Ibadan: University press

ISBN 978-139-103-0

Ofomata, C.E. (2013). Ndezu ụtọasụsụ Igbo nke ndi juniọ sekọndịrị.

Enugu. Format publishers.

Onuorah, J.C (2021). Usoro ọmụmụ Igbo ụtọasụsụ, agụmagụ na omenala maka sịnịo sekọndịrị. Onitsha: patomonic printer & publishers. ISBN-978-978-48032-3-6

Osuagwu, B.I.N (1979). Ndị Igbo na omenaala ha. Onitsha: Macmillian

Nigeria Publishers.

Onwuejeogwu. M. A. (1992). The social anthropology of Africa. lbadan:

Gold press.

Ubesie, T. (1978). Odinala ndi Igbo. Ibadan: University press.

Downloads

Published

2023-12-31 — Updated on 2023-12-31