IWEGHARA KATUUN N’ỌNỌDỤ AKỤKỌ IFO N’IKUZIRI ỤMỤAKA IHE: ILEBA ANYA N’AKWỤKWỌ IGBO NDỊ A HỌỌRỌ

Authors

  • Chioma Chiazom Anagor Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka na Eshia Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka Steeti Anambara, Naịjirịa

Abstract

Akụkọ ifo bụ akụkọ ndị nna nna anyị ha dobere nke a na-akọkarị n’egwụ ọnwa maọbụ n’uhuruchi mgbe a na-ezuike. A na-eji ya akụziri ụmụntakịrị na ndị ntorobịa ihe. Akụkọ ifo na-enwe agwa, agwa ọ bụla na-enwe aha yiri agwa ọ na-akpa, akụkọ ahụ ga-enwekwazị ihe ụmụaka nụrụ ya gaakọwanwu ha mụtara. Mana oge ugbu a, mmepe obodo agbanweela ọtụtụ ihe na ndụ ndị Igbo. E nweghịzị ihe dịka egwu ọnwa n’obodo.Ndị mmadụ na-aba n’ụlọ ma chi jie kiriwe onyoonyo. Site na mgbanwe ihe nkiri onyoonyo a ka ndị ọcha jiri webata katuun nke bụkarịrị ihe nkiri ụmụaka. Katuun nwere ndị nwere ezi ihe mmụta mana ọtụtụ n’ime ha abụghị ihe ụmụaka ga-elele. Ha enweghị aha ndị isi ojii na-aza ma sị kwuwe aha Igbo, ha enweghị akụkọ gbasara ndị isi ojii ma ya fọdụ ndị Igbo. Ụfọdụ ihe na-eme na ya bụ ihe gbasara inwe ike mmụọ. Ụfọdụ katuun na-ezipụta ihe ezighị ezi ụmụaka ilele, n’ihi nke a, nwanchọcha nwere mkpali mmụọ ide n’isiokwu a ka agbaa n’anwụ uru akụkọ ifo bara na mpụtara katuun na ndụ ndị Igbo n’ebe ikuziri ụmụaka ezi ihe mmụta dị. A gbasoro usoro nkọwa site n’ịlebara anya n’akụkọ ifo atọ dị n’akwụkwọ agụmagụ Nza na obu, Mbediọgụna A na-agwa nti.Katuun atọ ndị a họọrọ bụ “ụmụnwaanyị pawapofụ”, “slipin biwuti” na “Vamparina”. Atụlechaala wee chọpụta ndịiche dị n’etiti akụkọ ifo na katuun, mmebere nke ọ bụla, uru na ọghọm na ihe mmụta dị na ha. A tụkwara alo gbasara ihe ụmụ afọ Igbo ga-eme wee kwalite akụkọifo. Ọ bụ eziokwu na e nweela ọtụtụ mgbanwe n’obibi ndụ site na mmepe obodo mana nke anyị bụ nke anyị makana ndị Igbo nwere usoro ha si ebi ndụ ha.

References

Achara, D.N. (1989). Elelịa naihe o mere. Legoos: Longman Publishers

Agwụna, S.O. (2004). A na-agwa ntị.Ọnịcha: Lincel Publishers

Anachebelụ, A. (2019). “Igbo folktales. Kedụuru akụkọifo baara ndị Igbo?” Wetere n’ọnwa

Disemba 8, 2020. Site na https://www.bbc.com>Igbo>Afirika

Anisha, N. (2018). “Positive and negative effects of cartoons on child behaviour and

development”. Wetere n’ọnwa Disemba 8, 2020. Site nahttps://www.parentry.firstcry.com

Dew, M.C. (2019). “8 children’s cartoons to avoid that teaches bad habits”. Wetere n’ọnwa Eprel

, 2021. Site na https://www.asiaone.com

Ikedimma, C.E. (2008). Ụmị agụmagụ ọdinaala na nke edereede. Ọnịcha: Uchac production.

Nnabụịhe, C. (2019). “Igbo folktales. Kedụuru akụkọifo baara ndị Igbọ?” Wetere na Disemba 8,

Site nahttps://www.bbc.com>Igbo>Afirika

Nwadike, I.U. (2003). Agụmagụọdịnala Igbo.Ọnịcha: Africana First Publishers.

Nze, A.I. (2001). Nchịkọta akwụkwọ maka ule sekọndiri WASSCE 2011-2015. Nnewi: Missfav

Publishers.

Ọgbalụ, F.C. (1997).Nza naObu. Lagos: Thomas Nelson Nigeria

Okafor, N.J. (2010). Mmalite agụmagụ edereede Igbo. Ọnịcha: Mid-field publishers.

Osuagwu, B.I.N. (1982). Ikuzi Igbo. Ibadan: African University press.

Toonstory.I.(2018). “Types of cartoon”. Wetere n’ọnwa Disemba 8, 2020. Site

nahttps://www.toonstory.Ịn

Uzochukwu, S. (2007).Akanka na nnyocha agụmagụ Igbo. Enugwu: Sam Orient publishers.

Zafarris, J. (n.d). “The elymology of cartoon”. Wetere n’ọnwa Disemba 8, 2020. Site

nahttps://www. uselessetemology.com

Downloads

Published

2025-01-26 — Updated on 2021-06-13

Versions