IWEGHARA KATUUN N’ỌNỌDỤ AKỤKỌ IFO N’IKUZIRI ỤMỤAKA IHE: ILEBA ANYA N’AKWỤKWỌ IGBO NDỊ A HỌỌRỌ
Abstract
Akụkọ ifo bụ akụkọ ndị nna nna anyị ha dobere nke a na-akọkarị n’egwụ ọnwa maọbụ n’uhuruchi mgbe a na-ezuike. A na-eji ya akụziri ụmụntakịrị na ndị ntorobịa ihe. Akụkọ ifo na-enwe agwa, agwa ọ bụla na-enwe aha yiri agwa ọ na-akpa, akụkọ ahụ ga-enwekwazị ihe ụmụaka nụrụ ya gaakọwanwu ha mụtara. Mana oge ugbu a, mmepe obodo agbanweela ọtụtụ ihe na ndụ ndị Igbo. E nweghịzị ihe dịka egwu ọnwa n’obodo.Ndị mmadụ na-aba n’ụlọ ma chi jie kiriwe onyoonyo. Site na mgbanwe ihe nkiri onyoonyo a ka ndị ọcha jiri webata katuun nke bụkarịrị ihe nkiri ụmụaka. Katuun nwere ndị nwere ezi ihe mmụta mana ọtụtụ n’ime ha abụghị ihe ụmụaka ga-elele. Ha enweghị aha ndị isi ojii na-aza ma sị kwuwe aha Igbo, ha enweghị akụkọ gbasara ndị isi ojii ma ya fọdụ ndị Igbo. Ụfọdụ ihe na-eme na ya bụ ihe gbasara inwe ike mmụọ. Ụfọdụ katuun na-ezipụta ihe ezighị ezi ụmụaka ilele, n’ihi nke a, nwanchọcha nwere mkpali mmụọ ide n’isiokwu a ka agbaa n’anwụ uru akụkọ ifo bara na mpụtara katuun na ndụ ndị Igbo n’ebe ikuziri ụmụaka ezi ihe mmụta dị. A gbasoro usoro nkọwa site n’ịlebara anya n’akụkọ ifo atọ dị n’akwụkwọ agụmagụ Nza na obu, Mbediọgụna A na-agwa nti.Katuun atọ ndị a họọrọ bụ “ụmụnwaanyị pawapofụ”, “slipin biwuti” na “Vamparina”. Atụlechaala wee chọpụta ndịiche dị n’etiti akụkọ ifo na katuun, mmebere nke ọ bụla, uru na ọghọm na ihe mmụta dị na ha. A tụkwara alo gbasara ihe ụmụ afọ Igbo ga-eme wee kwalite akụkọifo. Ọ bụ eziokwu na e nweela ọtụtụ mgbanwe n’obibi ndụ site na mmepe obodo mana nke anyị bụ nke anyị makana ndị Igbo nwere usoro ha si ebi ndụ ha.References
Achara, D.N. (1989). Elelịa naihe o mere. Legoos: Longman Publishers
Agwụna, S.O. (2004). A na-agwa ntị.Ọnịcha: Lincel Publishers
Anachebelụ, A. (2019). “Igbo folktales. Kedụuru akụkọifo baara ndị Igbo?” Wetere n’ọnwa
Disemba 8, 2020. Site na https://www.bbc.com>Igbo>Afirika
Anisha, N. (2018). “Positive and negative effects of cartoons on child behaviour and
development”. Wetere n’ọnwa Disemba 8, 2020. Site nahttps://www.parentry.firstcry.com
Dew, M.C. (2019). “8 children’s cartoons to avoid that teaches bad habits”. Wetere n’ọnwa Eprel
, 2021. Site na https://www.asiaone.com
Ikedimma, C.E. (2008). Ụmị agụmagụ ọdinaala na nke edereede. Ọnịcha: Uchac production.
Nnabụịhe, C. (2019). “Igbo folktales. Kedụuru akụkọifo baara ndị Igbọ?” Wetere na Disemba 8,
Site nahttps://www.bbc.com>Igbo>Afirika
Nwadike, I.U. (2003). Agụmagụọdịnala Igbo.Ọnịcha: Africana First Publishers.
Nze, A.I. (2001). Nchịkọta akwụkwọ maka ule sekọndiri WASSCE 2011-2015. Nnewi: Missfav
Publishers.
Ọgbalụ, F.C. (1997).Nza naObu. Lagos: Thomas Nelson Nigeria
Okafor, N.J. (2010). Mmalite agụmagụ edereede Igbo. Ọnịcha: Mid-field publishers.
Osuagwu, B.I.N. (1982). Ikuzi Igbo. Ibadan: African University press.
Toonstory.I.(2018). “Types of cartoon”. Wetere n’ọnwa Disemba 8, 2020. Site
Uzochukwu, S. (2007).Akanka na nnyocha agụmagụ Igbo. Enugwu: Sam Orient publishers.
Zafarris, J. (n.d). “The elymology of cartoon”. Wetere n’ọnwa Disemba 8, 2020. Site
nahttps://www. uselessetemology.com